Fraide Izu nke mbu n'oge na-adanyeghi n'emume St. Anthony the Great - Memorial - White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 4: 1-5, 11
-
Abụọma na azịza ya
Ps 78: 3-4bc, 6c-7, 8
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 2:1-12
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Heb 4: 1-5, 11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Hibru
Ya bụ, otu ọ bụ na nkwa ịbanye n'izu ike ya ka dị, ka anyị tuonu egwu, n'ihi na e nwere ike ikpe otu n'ime unu ikpe na ọ rụghị ya. N'ihi na anyị nụrụ ozi ọma ahụ dịka ha si nụ ya. Ozi ọma ahụ ha nụrụ abaghị ha uru ọ bụla, n'ihi na mgbe ha nụrụ ya, ha ejighị okwukwe nabata ya. Anyị bụ ndị kwere ekwe bara n'izu ike ahụ. Dịka ọ sị kwuo, "Dịka m si nuo iyi n'iwe m, ha agaghị abata n'izu ike m." Ọ bụ eziokwu na ọ rụsiri ọrụ ya niile mgbe ahụ ọ toro ntọala nke ụwa. Ọ nwere ebe ọ kwụrụ maka ụbọchị nke asaa, sị, "Ma Chineke zuru ike n'ihe ọrụ ya n'ụbọchị nke asaa." Ọzọkwa, n'otu ebe ahụ, ọ sịrị, "Ha agaghị abata n'izu ike m." Ya bụ, ka anyị nwalee ike anyị ịbanye n'ezumike ahụ, ka a ghara inwe onye ga-adapụ site na nnupuisi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 78: 3-4bc, 6c-7, 8
Echezona ọrụ nke Onyenweanyi
1. Ihe anyị nụrụ ma matakwa n'onwe anyị nke ndị nna nna anyị gwara anyị,
Ka anyị ghara ekpuchi ya n'anya ụmụ ha,
kama anyị ga-eme ka ụmụ-azụ anyị mata ya,
Ihe ndị a bụ: idi ukwu nke Onyenweanyi,
ike ya na ọrụ ebube niile ọ ruru.
Azịza: Echezona ọrụ nke Onyenweanyi
2. Ka agbụrụ na-abịa abịa were mata ha, wee nwee ike kuziere ụmụ ha,
ka ha wee nwee ntukwasị obi na Chineke, ghara ichefu ọrụ nke Chineke niile,
ma na-edebe iwu ya.
Ya mere ka ha ghara ịdị ka ndị nna ha ochie, agbụrụ nzuzu na-ekweghị ekwe,
agbụrụ ndị obi ha akwụsịghị ike, ndị mmụọ ha enweghị nrube isi n'ebe Chineke nọ.
Azịza: Echezona ọrụ nke Onyenweanyi
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Onyenweanyi dị ntukwasi obi n'okwu ya niile,
omume ya niile jupụtara n'obi ebere.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 2:1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka ụbọchị ole na ole gachara, Jesu laghachiri na Kapanaum, akụkọ wee gbasaa na ọ nọ n'ụlọ. Ma ọtụtụ mmadụ zukọta, nke mere na ohere ọ bụla adịghịkwa, ọbụladị n'ọnụ ụzọ; ma o gwara ha okwu Chineke. Ụfọdụ mmadụ butere ya otu onye akụrụ ya kponwuru akpọnwụ, nke mmadụ anọ n'ime ha bu. Ebe ha na-enweghi ike ibubata ya nso n'ihi igwe mmadụ ahụ, ha meghere oghere n'elu ụlọ, n'akụkụ ebe ahụ Jesu nọ. Mgbe ha meghechara ya, ha budara onye ahụ a kponwuru akpọnwụ n'ute o na-edina. Ma mgbe Jesu hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ akụrụ ya kponwuru akpọnwụ, "Nwa m, a gbagharala gị mmehie gị niile." Ụfọdụ ndị odeakwụkwọ nọdu ebe ahụ na-ajụ n'ime obi ha sị, "Gịnị mere nwoke a ji ekwu okwu otu a? Ọ bụ nkwulu! Ònye nwere ike igbaghara mmehie ma ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke?" Ngwangwa, Jesu chọpụtara n'obi ya na ha na-atụle okwu ahụ n'ime obi ha; ọ jụrụ ha sị, "Gịnị mere unu ji atụle okwu a otu a n'ime obi unu? Òlee nke ka mfe ime, ịsị onye akụrụ ya kponwuru akpọnwụ, 'A gbagharala gị mmehie gị niile' ka ọ bụ ịsị ya, 'Bilie chiri ute gị gawa?' Ma ka unu mara na Nwa nke mmadụ nwere ike igbaghara mmehie n'ụwa a," ọ sịrị onye ahụ akụrụ ya kponwuru akpọnwụ, "Ana m agwa gị, bilie, chiri ute gị laba." Ọ biliri, chiri ute ya ngwangwa, si n'ihu ha niile pụọ. Nke a turu ha niile n'anya, ha wee too Chineke, sị, "Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a mbụ!"
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu