Wenezde Izu nke mbu n'oge na-adanyeghi n'emume

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 2:14-18
-
Abụọma na azịza ya
Ps 105:1-2, 3-4, 6-7, 8-9
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 1:29-39
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ ; Heb 2:14-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshịa
Ebe ọ bụ na ụmụ ahụ kụrụ oke n'ụdị inwe ahụ na ọbara, ya onwe ya kụtakwara oke n'otu ụdị ahụ ahụ, ka ọ wee site n'onwe mebie ekwensu bụ onye ahụ ji ike nke ọnwụ. Otu a ka o siri mee ka ndị ahụ niile nwere onwe ha bụ ndị ujo ọnwụ mere ka ha buru ndị e kere agbu na ndụ ha niile. N'eziokwu, ndị dị ya mkpa abụghị ndị mmụọ oma, kama ọ bụ agbụrụ Abraham. Nke a mere ọ ji dị mkpa na ọ ga-eyi umunna ya n'ihe niile ka ọ wee buru ha onyeisi nchuaja nwere obi ebere na nke kwesiri ntukwasiobi n'ije ozi nke Chineke, ka ọ wee medaa Chineke obi maka njọ ndị mmadụ. N'ihina ya onwe ya ataala ahụhụ ma nwee kwa onwunwa. Nke a mere ka ọ nwee ike inyere ndị nọ n'onwunwa aka.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 105:1-2, 3-4, 6-7, 8-9
Azịza : Ọ na-akpachapuru ogbugbandu ya anya ebeebe.
1. Alleluia: Nyenu Chineke ekele kpokụọ aha ya, kwuputaranu mba niile ọrụ ebube ya!
Chetanu ọrụ ebube niile o ruru, ọrụ itunanya ya niile, na ikpe niile si n'onu ya pụta.
2. O na-akpachapuru ogbugbandu ya anya ebeebe,
Iwu nke o tiri puku agburu gara aga.
Ogbugbandu ya na Abraham gbara na iyi nke o nụrụ Aizik.
3. Unu, ụmụ Abraham, bụ nwa-dịbo ya,
Umu Jakọb bụ onye nke o hooro!
Ọ bụ ya nu Onyenweanyi na Chineke anyị!
Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile.
4. O na-akpachapuru ogbugbandu ya anya ebeebe,
Iwu nke o tiri puku agburu gara aga.
Ogbugbandu ya na Abraham gbara na iyi nke o nụrụ Aizik.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Onye nzọpụta anyị Jesu Kristi mebiri ọnwụ,
wetara anyị ndụ,
bja mee ka anwuanwu pụta ihe site n'ozioma ahụ.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 1:29-39
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe ha si n'ụlọnsụkọ ahụ pụta n'atụfughị oge, Jesu na Jemis na Jon banyere n'ụlọ Saimon na Andru. Ma nne nwunye Pita di na ahụ oku. Ozigbo ahụ, ha kọọrọ Jesu maka ahụ mgbu ya. Ọ jekwuuru ya, jide ya n'aka, wee selite ya. Ahu oku ahụ hapụrụ ya. Ọ wee malite ile ha obja. Na mgbede ahụ, mgbe anyanwụ dachara, ha kpotaara Jesu ndị niile ahụ na-adịghị na ndị mmụọ ọjọọ ji. Ndị obodo ahụ niile zukoro n'ihu ụlọ nke Jesu nọ n'ime ya. Ọ gworo ọtụtụ ndị mmadụ nwere nrjanrja dị iche iche. Ọ chupukwara ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ kweghị ha kwuo okwu n'ihi na ha maara onye ọ bụ. Jesu biliri n'isi ụtụtụ tupu chi abọọ gaa ebe dara jii, ma nọ ebe ahụ kpee ekpere. Saimon na ndị ya na ha nọ bidoro chọghariba ya. Mgbe ha chọtara ya, ha siri ya, "Mmadụ niile na-achoghari gị." Ma ọ siri ha, "Ka anyị gaanụ n'obodo ndị ọzọ, ka m nwee ike kwusakwaa okwu Chineke n'ebe ahụ; ọ bụ n'ihi nke a ka m jiri bja." Ọ gara n'obodo Galili niile, na-ezisa ozioma n'ụlọ ha na-achupukwa mmụọ ọjọọ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu