Tuzde Izu nke mbu n'oge na-adanyeghi n'emume

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 2:5-12
-
Abụọma na azịza ya
Ps 8: 2ab and 5, 6-7, 8-9
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 1:21-28
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Heb 2:5-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Hibru
Ọ bụghị ndị mmụọ oma ka Chineke mere ka ha buru ndị ga-achi ụwa a, ga-abianu bụ nke anyị na-ekwu maka ya. A gbaala akaebe ya n'otu ebe si, "Olee ihe mmadụ bụ nke na ị na-akpachapuru ya anya?!" mere ya ka ọ dị ala ntakịrị karị ndị mmụọ oma, iji otito na nsopuru kpụwa ya n'isi dị ka ọkpueze, na-etinyekwa ihe niile n'okpuru ya. Ugbu a, n'itinye ihe niile n'okpuru ya, ọ nweghị ihe ọ bụla nke ọ hapụrụ itinye n'okpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahubeghị ya ka ọ na-achi ihe niile. Ma anyị na-ahu Jesu, onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karị ndị mmụọ oma ka e ji otito na nsopuru kpụwa ya ọkpueze n'ihi áhụhụ nke ọnwụ, ka ọ buru na site n'amara nke Chukwu ka ọ wee nwuo maka mmadụ niile. N'ihina ọ kwesiri ekwesi na onye ihe niile si n'aka ya dị, na onye ihe niile dị n'aka site n'ikpobata ọtụtụ ụmụ Chineke n'otito ga-eme ka onye ndu nke nzọpụta ha zuo oke site n'ahụhụ. N'ihina ma onye ahụ nke na-edo ha nso, ma ndị ahụ a na-edo nso, ha niile nwere otu mbido. Nke a mere ihere anapụghị ya ikpo ha umunna, na-ekwu si, "Aga m ekwuputa aha gị n'ebe umunna m nọ, aga m eto gị n'etiti nke nzukọ."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 8: 2ab and 5, 6-7, 8-9
Azịza: I mere Nwa Gị Nnaukwu ihe niile e kere eke, were ihe niile dobe n'okpuru ya.
1. Onyenweanyi Chineke anyi!
Lee ka aha Gị siri di elu n'ụwa niile.
Gịnị ka mmadụ bụ iji eche echiche banyere ya?
Nwa nke mmadụ na ị na-eleta ya anya?
Azịza: I mere Nwa Gị Nnaukwu ihe niile e kere eke, were ihe niile dobe n'okpuru ya.
2. N'agbanyeghi, I mere ka o jiri obere ihe karị ndị mmụọ oma nta,
I jikwa ugwu na nsopuru chọọ ya mma dị ka ọkpueze.
I mere ya nnaukwu ihe niile e kere eke, were ihe niile dobe n'okpuru ya.
Azịza: I mere Nwa Gị Nnaukwu ihe niile e kere eke, were ihe niile dobe n'okpuru ya.
3. O na-achi umuaturu na ehi, ya na umuanuo igwe,
O na-achi umunnunu nke igwe,
azu di na mmiri, na anu ndiozo di n'osimiri.
Azịza: I mere Nwa Gị Nnaukwu ihe niile e kere eke, were ihe niile dobe n'okpuru ya.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ
Gị putara ka m wee nwee ike ịchịghari ọrụ
I tụnanya Gị n'obi m.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 1:21-28
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya batara na Kapanaum, o banyeere n'ụlọnsụkọ ha ozugbo ahụ n'ụbọchị Sabat na-akuzi ihe. Nkuzi ya turu ha n'anya, n'ihina o kuziiri ha ihe dị ka onye nwere ikikere, ọ bụghị dị ka ndị odeakwụkwọ ha. Ozigbo ahụ, e nwere otu nwoke mmụọ ọjọọ ji n'ụlọnsụkọ ahụ; onye nke tiri mkpụrụ si, "Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, Jesu onye Nazaret?! Biara ila anyị n'iyi? Ama m onye bụ: Onye Nso nke Chineke." Jesu gbojara ya si, "Mechie onu, sikwa n'ime ya pụta." Mmuo ọjọọ ahụ mere ka ihe odudo doo ya, tikwa mkpụrụ n'olu ike, wee si n'ime ya pụta. Oru ebube ahụ juru mmadụ niile anya, nke mere ha jiri malite jụrụ otu onwe ha si, "Gịnị bụ nke a? Ọ bụ nkuzi ọhụụ. Ọ ji ikikere na-enye ọ bula mmụọ ọjọọ iwu, ha wee na-erubere ya isi." Ngwangwa, akụkọ banyere ya wee gbasaa n'ebe niile, n'ala niile dị Galili gburugburu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu