Ncheta Theodosius Nke Cenobiarch - White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Jn 5: 14-21
-
Abụọma na azịza ya
Ps 149: 1-2, 3-4, 5, 6a, 9b
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJn 3: 22-30
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : 1 Jn 5: 14-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jon
Nke a bụ ntukwasi obi anyị nwere na ya, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọ bụla dị ka uche ya si dị, ọ na-ege anyị ntị. Ọ bụrụ na anyị ma na ọ na-ege anyị ntị n'ihe ọ bụla anyị rịọrọ, anyị maara na anyị enwetala ihe niile anyị rịọrọ ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla a hụrụ nwanne ya n'anya ka o na-eme obere njo, o ga-arịọ ya arịrịọ, Chineke ga-enye nwanne ya ahụ ndu, maka na njo ahụ abụghị njo ogbugbu. E nwere njo nke bụ nnukwu njo. Anaghị m ekwu ka mmadụ kpee ekpere maka nke ahụ. Omume niile na-ezighi ezi bụ njo. Mana e nwere nke na-abụghị nnukwu njo. Anyị maara na onye ọ bụla a mụrụ na Chineke anaghi eme njo, n'ihi na Kristi, Nwa nke Chukwu, na-echekwa ya. Onye iro ahụ anaghi emetụ ya aka. Anyị maara na anyị bụ ndị nke Chineke, mana ụwa niile nọ n'ike nke ajọ onye ahụ. Anyị makwa na Nwa nke Chukwu abiala, o nyekwara anyị nghọta imata onye ahụ bụ Eziokwu. Anyị nọkwa n'ime onye ahụ bụ Eziokwu, n'ime Nwa ya bụ Jesu Kristi. Nke a bụ ezi Chineke ahụ na ndu ebighị ebi. Umuntakiri, zerenu ikpere arusi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 149: 1-2, 3-4, 5, 6a, 9b
Azịza: Onyenweanyi nwere ihunaanya n'ebe ndị nke ya nọ.
1. Kwerenu Onyenweanyi ukwe ọhụrụ,
Ka ogbako ndị kwere na ya kweere ya ukwe otito.
Ka Izrel nuru ọnụ n'ihi onye kere ya,
Ka ụmụ Zayon nuriba n'ihi onye eze ha.
Azịza: Onyenweanyi nwere ihunaanya n'ebe ndị nke ya nọ.
2. Ka ha were ịgba egwu too aha ya,
Jhunaanya n'ebe ndị nke ya nọ,
Kpubela ndị umeala okpu nke mmeri.
Azịza: Onyenweanyi nwere ihunaanya n'ebe ndị nke ya nọ.
3. Ka ndị nke ya nuria na mmeri ha.
Ka ha daa n'ala n'ihu Chineke,
Na eto ya oge niile.
Ka nnukwu ukwe otito Chineke juputa n'onu ha,
Ka ha were ịgba na ubo akwara gbaara ya egwu.
Nke a bụ otito nke ndị nke N'Ịhịa na Onyenweanyi nwere.
Ya kwere ekwe, Alleluia.
Azịza: Onyenweanyi nwere ihunaanya n'ebe ndị nke ya nọ.
Alleluia, Alleluia:
E kwusara ya na mba niile,
Onye ụwa niile kwere na ya,
E buliri ya elu n'otito.
Alleluia
OZIỌMA : Jn 3: 22-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe nke a gachara, Jesu na ndị na-eso ụzọ ya gara n'ala Judia, ya na ha nọ ebe ahụ na-eme ndị mmadụ mmirichukwu. Jon na-eme mmirichukwu n'Enon nke dị Salim nso, n'ihi na nnukwu mmiri dị ebe ahụ. Ndị mmadụ na-abjakwa, Jon na-eme ha mmirichukwu. Mgbe ahụ a tubabeghị Jon n'ulomkporo. Rurita uka daputara n'etiti ndị na-eso ụzọ Jon na otu onye Juu banyere ime ka ihe dị ọcha. Ha biakwutere Jon, si ya, "Rabai (onyenkuzi), onye ahụ gị na ya nọ n'ofe Jodan, nke ahụ ị gbara akaebe maka ya, na-eme mmirichukwu ugbu a, mmadu niile na-abjakwutekwa ya!" Jon zara si: "O nweghị onye nwere ike inata ihe ọ bụla ma ọ bụ na Chineke enyeghị ya. Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m kwuru si, 'Abughi m Kristi ahụ, kama e zitere m ka m buru ya ụzọ bia.'
Nwoke lụrụ nwaanyị bụ ya nwe nwaanyị, ọ bụ onye enyi ya na-eme bụ inonye ya na-ege ntị n'ihe ọ na-ekwu. O na-enwekwa anuri n'ihi na o na-anụ olu enyi ya nwoke lụrụ nwaanyị. Anuri m ezuola oke ugbu a. O ga na-abawanye, m onwe m ana-alo ala.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị ChukwuMbeku