Emume Agatho Thaumaturgus

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Jn 5: 5-13
-
Abụọma na azịza ya
Ps 147: 12-13, 14-15, 19-20
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 5: 12-16
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: 1 Jn 5: 5-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbu Jon
Onye bụ onye na-emeri ụwa ma ọ bụ onye kwere na Jesu Kristi bụ Nwa Chukwu? Nke a bụ onye sitere na mmiri na ọbara bịa. Ọ bụghị nanị mmiri ka o ji bja, kama, ọ ji mmiri na ọbara. Mmuo ahụ bụ onye akaebe, n'ihi na ọ bụ eziokwu. E nwere ndi akaebe atọ: Mmuo, Mmiri, na Ọbara; ha atọ kwekọrọ na otu. Ọ bụrụ na anyị na-anabata akaebe nke mmadụ, akaebe nke Chineke bụ ezi akaebe karịrị. Akaebe nke Chineke bụkwa nke o gbara banyere Nwa ya. Onye kwere na Nwa nke Chineke, nwere akaebe ahụ n'ime ya. Ma onye na-ekwenyeghị n'akaebe ahụ, emeela Chineke onye ụgha, n'ihi na o kwenyereghị n'akaebe Chineke gbara gbasara Nwa ya.
Akaebe ahụ bụ nke a: Chineke enyela anyị ndu ebighị ebi. Ndụ a dị na Nwa ya. Onye nwere Nwa ahụ nwere ndu. Onye na-enweghi Nwa nke Chukwu, enweghi ndu. Ana m edere unu ihe ndị a, unu ndị kwere n'aha nwa nke Chukwu; ka unu mara na unu nwere ndu ebighị ebi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 147: 12-13, 14-15, 19-20
Azịza: Jerusalem too, Onyenweanyi!
1. Jerusalem too, Onyenweanyi!
Zayon too Chineke gi.
N'ịhụnanya, ọ bụ ya mere ọnụọgụ ama gị niile
Ka ha sie ike, o na-agozi ụmụ gị niile.
Azịza: Jerusalem too, Onyenweanyi!
2. O na-enye gị Udo n'oke ala gị niile.
O na-eji oka nke kacha mma azu gị nri.
O na-etiri ụwa iwuokwu ya agazuo ụwa niile ọsọsọ.
Azịza: Jerusalem too, Onyenweanyi!
3. O na-ekpughere ụmụ Jekob okwu ya,
Na-egosikwa ụmụ Izrel iwu ya na ikpe ya.
O naghị emere mba ndị ọzọ otu a,
O naghị akuziri ha iwu ya.
Azịza: Jerusalem too, Onyenweanyi!
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Jesu na-ekwusakwa ozioma nke alaeze Chineke.
O gwokwara ndị mmadụ ọrịa na nrianria ha dị iche-iche.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 5: 12-16
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka Jesu nọ n'otu obodo, otu nwoke ekpenta juputara ahụ bịa kwutere ya; mgbe o hụrụ Jesu, o dara, kpudo ihu n'ala na-arịọ ya si, "Dinwenu, ọ bụrụ na ị choro, i nwere ike ime ka m dị ọcha." Jesu gbatịrị aka ya, metụ ya aka si, "Achọrọ m; dị ọcha." Ngwa ngwa ọrịa ekpenta ahụ lara. Jesu nyere ya iwu ka o ghara igwa onye ọ bụla, kama, o siri ya, "Gaa gosi onye ụkọchukwu onwe gị, tuọkwa mmanya maka ịdị ọcha gị dịka Mosis nyere n'iwu ka ọ bụrụ ihe ga-egosi ndị mmadụ na ahụ adịla gị mma." Ma akụkọ gbasara Jesu gbasawanyere karịrị, oke igwe mmadụ wee gbakoo ka ha nuru okwu ya, nwetakwa ogwugwo ọrịa Jesu siri ebe ahụ pụọ, gaa n'ozara, ikpe ekpere.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu