Ncheta Adrian nke Canterbury

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Jn 4: 19 - 5: 4
-
Abụọma na azịza ya
Ps 72: 1-2, 14-15bc, 17
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 4: 14-22
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ 1 Jn 4: 19 - 5: 4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbu Jon
Anyị na-ahụ n'anya, n'ihi na ọ bụ uru ụzọ hụ anyị n'anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla asi, "Ahụrụ m Chineke n'anya," ma kpoo nwanne ya ásị, onye ahụ bụ onye ụgha. N'ịhụnanya, onye ọ bụla na-anaghị ahụ nwanne ya n'anya, bụ onye o na-ahụ oge niile, enweghi ike jhụ Chineke n'anya, onye o na-ehubeghị anya.
Iwu a ka anyị natara n'aka ya: na onye ọ bụla na-ahụ Chineke n'anya, ga-ahukwa nwanne ya n'anya. Onye ọ bụla nke kwere na Jesu bụ Kristi, bụ nwa nke Chukwu. Onye ọ bụla nke na-ahụ Nna n'anya, na-ahukwa Nwa ya n'anya. Otu a ka anyị si ama na anyị na-ahụ ụmụ Chineke n'anya: site n'ihu Chineke n'anya na site n'idobe iwu ya. Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edobe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa aro. Onye ọ bụla a mụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Ma mmeri ahụ nke anyị ji emeri ụwa bụ okwukwe anyị.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps 72: 1-2, 14-15bc, 17
Onyenweanyi mba niile dị n'ụwa ga-es ekpuru gi.
Nye eze ikpe nkwumoto gi, o Chineke,
nyekwa nwa eze ezi omume nke gi.
Aga na ekpere ha ekpere mgbe niile,
na agozikwa ya ụbọchị niile.
Az. Onyenweanyi mba niile dị n'ụwa ga-es ekpuru gi.
Ka o were nwee ike ichi ndi nke gi n'uzo ziri ezi.
Ngozi diri aha ya ebeebe;
nyekwa ndi ogbenye ikpe ziri ezi.
Az. Onyenweanyi mba niile dị n'ụwa ga-es ekpuru gi.
Ọ ga-esi na mmegbu na mmekpa ahụ zọpụta ndu ha;
ndu ha ga-adi oke ọnụ n'ihu ya.
Ka o digide dị ka anyanwụ agbụrụ niile dị n'ụwa nweta ngozi na ya;
ka mba ndị niile kpoo ya onye dị ngozi.
Az. Onyenweanyi mba niile dị n'ụwa ga-es ekpuru gi.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia
Dinwenu etela m ude ka m bugara ndi ogbenye ozioma,
ka m kwusaara ndi eji eji na ha enwerela onwe ha.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 4: 14-22
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu loghachiri na Galili n'ike nke Mmuo Nsọ; akụkọ ya wee gbasaa n'obodo niile gbara ebe ahụ gburugburu. O kuzikwara ihe n'ọtụtụ ulonzuko ndi Juu. Mmadụ niile na-enye ya otito. Jesu bịa na Nazaret ebe Ọ nọtọ; banye n'ulonzuko, n'ụbọchị izuike dịka o si eme. O wee bilie ịgụ ihe; ha nyere ya akwụkwọ Aizaya onye amụma.
O meghere akwụkwọ ahụ hụ ebe e dere si: "E nyela m Mmuo nke Dinwenu, makana Dinwenu etela m ude ka m bugara ndi ogbenye ozioma, ka m kwusaara ndi e ji eji na ha enwerela onwe ha, ka m kwusaara ndi kpuru isi na ha ahubala ụzọ, ka m mee ka ndi a na-emegbu emegbu nwee onwe ha. Ka m kwuputa afo amara nke Dinwenu." O kpuchiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye na-aga ozi, bịa n'ala. Mmadụ niile nọ n'ulonzuko lekwasịrị ya anya.
O malite igwa ha okwu si, "Taa, ka e mezuru na ntị unu ihe e dere n'akwukwo nso a." Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya. Okwu ebube niile si n'ọnụ ya pụta tukwara ha n'anya nke mere ha jiri juo si, "Onye a, ọ bụ nwa Josef?"
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu