Severin nke Noricum

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Jn 4: 11-18
-
Abụọma na azịza ya
Ps 72: 1-2, 10, 12-13
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 6: 45-52
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: 1 Jn 4: 11-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbu Jọn
Ndi m hụrụ n'anya, ebe ọ bụ na Chineke hụrụ anyị n'anya otu a, anyị kwesikwara jhurita onwe anyị n'anya. Ọ nweghi onye hụrụ Chineke. Ọ bụrụ na anyị hụrụ onwe anyị n'anya, Chineke na-anọgide n'ime anyị, ma na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke n'ime anyị. Otu a ka anyị ga-esi mara na anyị bi n'ime ya, ya onwe ya ebiri n'ime anyị n'ihi na ọ nyela anyị Mmuo ya.
Anyị ahụrụ, na-agbakwa akaebe na Nna ezitela Nwa ya ka ọ bụrụ onye nzọpụta nke ụwa. Onye ọ bụla na-ekwuputa na Jesu bụ Nwa Chineke, Chineke na-ebi n'ime ya, ya onwe ya na-ebikwa n'ime Chineke. Anyị maara, ma kwerekwa n'ihụnanya Chineke nwere n'ebe anyi nọ. Chineke bụ ịhụnanya; onye ọ bụla na-anọgide n'ihụnanya na-anọgide na Chineke, Chineke na-anọgidekwa n'ime ya. Otu a ka e si mee ka ịhụnanya zuo oke n'ebe anyị nọ, na anyị ga-enwe obi siri ike n'ubochi ikpe ahụ, n'ihi na otu ọ dị, ka anyị onwe anyị dikwa n'ụwa.
Ujo adịghị n'ihụnanya. Ịhụnanya zuru oke na-achupu egwu. N'ịhụnanya, ujo na ntaramahụhụ na-agako. Onye ọ bụla na-atu egwu, ezubeghị oke n'ịhụnanya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA : Ps 72: 1-2, 10, 12-13
Azịza: Onyenweanyi mba niile dị n'ụwa ga-esekpuru gi.
Nye eze ikpe nkwumoto gi,
o Chineke, nyekwa nwa eze ezi omume nke gi,
ka o were nwee ike ichi ndi nkegi n'uzo ziri ezi,
nyekwa ndi ogbenye ikpe ziri ezi.
Azịza: Onyenweanyi mba niile dị n'ụwa ga-esekpuru gi.
Eze ndị Tashish na eze obodo mmiri gbara gburugburu ga-efe ya.
Eze ndị Sheba na Seba ga-enye ya onyinye.
Azịza: Onyenweanyi mba niile dị n'ụwa ga-esekpuru gi..
Ọ ga-atohapu onye ogbenye kpokuru ya,
na ndi niile choro enyemaka ya.
Ọ ga-emere ndi ogbenyena ndi esighi ike ebere,
na azokwa ndu ndi nọ na mkpa.
Azịza: Onyenweanyi mba niile dị n'ụwa ga-esekpuru gi.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
E kwusara ya na mba niile;
onye ụwa niile kwere na ya,
e buliri ya elu n'otito.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 6: 45-52
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ngwangwa Jesu mere ka ndi na-eso ụzọ ya banye n'ugbommiri, buru ya ụzọ kwofee n'ofe nke ọzọ nke osimiri Betsajda, ma ya onwe ya nọdurụ izila igwe mmadụ ahụ. Mgbe o hapụrụ ha, o gara n'elu ugwu ikpe ekpere. N'oge uhuruchi, ndi na-eso ụzọ ya nọ n'ugbommiri n'etiti osimiri, ma Jesu nọ n'ala nanị ya. Mgbe o hụrụ na ndi na-eso ụzọ ya na-adogbu onwe ha n'inya ugbọ n'ịhụnanya ifufe na-efegide ha. N'ihe dịka elekere anọ nke ụtụtụ, o biakwutere ha, na-aga ije n'elu mmiri. O wee choo igafe ha, ma mgbe ha hụrụ ya ka o na-aga ije n'elu mmiri, ha chere na ọ bụ mmụọ, wee tie mkpu. Ha niile hụrụ ya, obi wee fepu ha. Ma ngwangwa Jesu siri ha, "Obi sie unụ ike, ọ bụ m, unu atula ujo!" O wee banyekwuru ha n'ugbommiri, ifufe wee kwusi. Ihe ndị a gbagwojuru ndi na-eso ụzọ ya anya. N'ịhụnanya, ha aghotaghi ihe banyere ogbe achicha ise ahụ o ji zuo igwe mmadụ maka na obi ha kpochiri akpochi.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu