Ubochi Ncheta RAYMOND OF PENAFORT

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Jn 4: 7-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps 72: 1-2, 3-4, 7-8
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 6: 34-44
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ 1 Jn 4: 7-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ Jọn
Ndi m hụrụ n'anya, ka anyi huritanu onwe anyi n'anya, n'ihina ịhụnanya si na Chineke pụta. Onye ọ bụla nwere ịhụnanya bụ nwa nke Chukwu. O makwaara Chukwu. Onye na-enweghi ịhụnanya amaghi Chukwu, n'ihina Chukwu bụ ịhụnanya. Otu a ka ịhụnanya Chineke si pụta ihè n'ebe anyi nọ, na o zitere naani otu Nwa ya n'ụwa ka anyi nwee ndu site na ya. N'udi a ka ịhụnanya di: ọ bụ na anyi ahula Chineke n'anya, kama, o hụrụ anyi n'anya ma zite Nwa ya, ka o bụrụ onye a ga-esi n'aka ya gbaghara njo anyi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA Ps 72: 1-2, 3-4, 7-8
Azịza: Onyenweanyi mba niile di n'ụwa ga-esekpuru gi.
Nye eze ikpe nkwumoto gi, o Chineke,
nyekwa nwa eze ezi omume gi,
N'uzo ziri ezi, o ga-azoputa umu ndi ogbenye,
zookwa umu ndi nọ na mkpa.
Azịza: Onyenweanyi mba niile di n'ụwa ga-esekpuru gi
2. Ka o were nwee ike ichi ndị nke gi n'uzo ziri ezi.
N'oge ya eziomume ga-achawaputa,
nyekwa ndi ogbenye ikpe ziri ezi.
Azịza: Onyenweanyi mba niile di n'ụwa ga-esekpuru gi.
Ka ugwu ukwu na ugwu nta niile
wetara ndị nke gi ozi udoudo ga-adikwa ruo na njedebe ụwa,
alaeze ya ga esi n'osimiri ruo n'osimiri,
bido na mmiri ruo n'isi ngwucha nke ụwa.
Azịza: Onyenweanyi mba niile di n'ụwa ga-esekpuru gi
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Nnukwu onye amuma ebilitelä n'etiti anyi,
Chineke abjala ileta ndị nke ya.
Alleluia
OZIỌMA Mk 6: 34-44
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ka Jesu ridatara n'ugbo, o hụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ka ha gbakoro. O nwere obi ebere n'ebe ha nọ n'ihina ha dị ka aturu na-enweghi onye nche. O wee malite ikuziri ha ọtụtụ ihe. Mgbe chi na-eji, ndị na-eso ụzọ ya biakwutere ya si, "Ebe a bụ ozara, chi na-ejikwa ugbu a, zila ha ka ha gaa chọọrọ onwe ha ebe ha ga-azuta nri n'obodo ndị a dị anyị gburugburu." Ma Jesu zara ha si, "Nyenu ha ihe ha ga-eri." Ha wee juo ya si, "Anyi ga-eje izuta ogbe achicha nke nari dinari abuo iji nyejuo ha afọ?" O juru ha si, "Ogbe achicha ole ka unụ nwere? Gaanu chọpụta." Mgbe ha chọpụtara, ha zara ya si, "Ogbe achicha ise, na azu abuo." O wee nye iwu ka ha niile nọdu ala n'otu n'otu, n'elu ahihja ndu. Ha nọdurụ ala n'igwe n'igwe, ụfọdụ dị narị mmadụ, ụfọdụ dị iri ise. O naara ogbe achicha ise na azu abuo ahụ, lelie anya n'eluigwe, gozie ha, nyawaa ogbe achicha ndị ahụ, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere ndị mmadụ. O keere ha niile azu abuo ahụ. Ha niile rijukwara afọ. Ha tutujuru nkata iri na abuo site n'iberibe achicha na azu foro afọ. Ndị riri ogbe achicha ise ahụ dị puku mmadụ ise.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu