Ụbọchị Ncheta Andre Bessette

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1Jn 3: 22-4:1-6
-
Abụọma na azịza ya
Ps 2: 7bc-8.,10-12a
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt 4: 12-17. 23-25
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : 1Jn 3: 22-4:1-6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jọn dere
Anyi na-anata n'aka ya, ihe obula anyį na-ario, n'ihina anyi na-edobe iwu ya na-emekwa ihe na-amasi ya. Nke a bu iwu ya; na anyi ga-ekwenye n'aha nke Nwa ya bu Jesu Kristi ma huritakwa onwe any i n'anya di ka o si nye anyi n'iwu. Ndi niile na-edobe iwu ya na-ebi n'ime ya, ya onwe ya na-ebikwa n'ime ha. N'uzo di otu a, anyi na-ama na o bi n'ime anyi, site na Mmuo nke o nyere anyi. Ndi m huru n'anya, unu ekwenyela mmuo niile, kama nwaleenu mmuọ niile ka unų choputa ma ha bụ mmuo nke Chukwu. N'ihina otutu ndiamuma ugha ejuputala n'ime uwa. Otu a ka unu ga-esi mata nke by Mmuo Chineke. Mmuo obula nke na-ekwuputa na Jesu Kristi biara n'udi mmadu bụ mmuo nke Chineke. Nke na-anaghị ekwuputa Jesu Kristi abughi Mmuo nke Chineke. Nke a bu̟ mmuo nke onye iro Kristi, nke unų nurula na o na-abia, ugbu a, o norolari n'uwa. Umuntakiri, unu bu ndi nke Chineke, unų emerikwaala ha; n'ihina onye no n'ime unų kariri onye ahu nke no n'uwa. Ha bụ ndị nke uwa, ihe ha na-ekwu bu nke uwa. Uwa na-egekwa ha nti. Anyi bu ndi nke Chineke.b Onye obula maara Chineke na-ege anyi nti. Onye na-abughi onye nke Chineke anaghi ege any! nti. Site n'uzo di otu a, anyi ga-amata Mmuo nke eziokwu na mmuo nke ugha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 2: 7bc-8.,10-12a
Aga m enye gi mba niile, ka ha buru nke gi.
1. Onyenweanyi gwara m si,
'! by nwa m, taata A burula m nna gi.
Rio m aririo, aga m enye gi mba nile,
ka ha buru nke gi;ka akuku uwa niile buru ebe ochichi gi.
Az. Aga m enye gi mba niile, ka ha buru nke gi.
Ya bu ugbu a, unu ndi eze,mutanu ako ndi ochichi nke uwa,
kpacharanu anya Febenu Yahweh, tubanu ya egwumaanu jijiji n'ihu ya,
ma susuo ukwu ya onu.
Az. Aga m enye gi mba niile, ka ha buru nke gi.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ndi bi n'ochichiri ahula oke ihe.
The achakwasila ndi bi na ndagwurugwu onwu.
Alleluia
OZIỌMA : Mt 4: 12-17. 23-25:
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matu dere
Mgbe Jesu nuru na e jidela Jon, Ọ laghachiri Galili. o hapuru Nazaret, gaa biri na Kapanaum nke di n'akuku osimiri di n'oke ala Zebulun na nke Naftali. Nke a bu iji mejuputa ihe onye amuma Aizaya kwuru si, "Ala Zebulun na ala Naftali, Nke di n'akuku Osimiri, n'ofe nke Jodan, Galili nke ndi mba ozo. Ndi bi n'ochichiri ahula oke ihè ìhè achakwasila ndi bi na ndagwurugwu onwu."Site n'oge ahu Jesu malitekwara ikwusa ozioma si, "Chegharianu, n'ihina alaeze eluigwe adila nso."Jesu na-agaghari na Galili niile na-akuzi ihe n'ulo nzuko ha, na-ekwusakwa ozioma nke alaeze Chineke. O gwokwara ndi mmadu orja na nrianria ha di icheiche. Ude Jesu gbasara n'ala Judia niile nke na ndi mmadų na-akpotara ya ndi niile ahu na-adighi ike, ndi orja na ahumgbu di icheiche. Ha kpotakwara ndi ajo mmuo ji, ndi akwukwu na-ado na ndi akuku ahu ha kponwuru akponwu. Jesu gworo ha niile. Oke igwe mmadu siri na Galili, Dekapolis, Jerusalem, Judia na ofe Jodan soro Jesu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu