Ụka nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Isa: 61:1-2, 10-11.
-
Abụọma na azịza ya
Luk 1:46-50. 53-54. Aịz. 61:10
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1 Tesa. 5:16-24
- OziọmaJọn 1:6-8, 19-28
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Isa: 61:1-2, 10-11.
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya.
E nyela m mmụọ nke Onyenweanyị, n’ihi na Onyenweanyị eteela m ude. O zipụla m ka m butere ụmụ ogbenye Oziọma, ka m jikọọ obi gbawara agbawa; ka m tọhapụ ndị e ji eji n’agbụ ha, meghepụkwara ndị nọ n’ụlọ nga ụzọ ka ha nwere onwe ha, bịakwa kwupụta afọ amara nke Onyenweanyị.
“Ana m awụli elu n’ọñụ n’ime Onyenweanyị. Mmụọ m na-añụrị ọñụ na Chineke m, n’ihi na O yiwela m uwe nke nzọpụta, bịakwa chịrị akwa mwụda nke ezi omume kpuchie m; dị ka nwoke na-agba akwụkwọ si ekpu okpu mara mma; dịka nwanyị e ji agba akwụkwọ si e were ihe ejiji ya chọọ onwe ya mma.
“N’ihi na otu ala si eme ka ihe dị ndụ na-etolite; dịka ala ọrụ ubi si eme ka ihe a kụrụ n’ime ya na-epulite, otu ahụkwa ka Onyenweanyị ga-esi mee ka eziomume na otito pulite n’ihu mba niile.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Luk 1:46-50. 53-54. Aịz. 61:10
Azịza: Mmụọ m na-añụrị ọñụ na Chukwu m.
1. Ọ na-eto Dinwenụ bụ mkpụrụobi m.
Mmụọ m na-añụrị na Chineke Onye Nzọpụta m.
O leela anya n’adịghị ike nke odibo nwanyị Ya.
Site taa gawa, ndụdụgandụ niile na-akpọ m onye dị ngọzi.
Azịza: Mmụọ m na-añụrị ọñụ na Chukwu m.
2. Onye ji ike niile emeerela m nnukwu ihe itụnanya: aha Ya dị asọ.
Ebere Ya si na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ maka ndị na-atụrụ Ya egwu.
Azịza: Mmụọ m na-añụrị ọñụ na Chukwu m.
3. O jila ihe ọma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ;
bịakwa chụpụ ndị ọgaranya n’enyeghị ha ihe ọ bụla.
O chekwawara Izrel nwodibo Yan a ncheta ebere Ya.
Azịza: Mmụọ m na-añụrị ọñụ na Chukwu m.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1 Tesa. 5:16-24
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Tesalonịka.
Hụnụ na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụnụ nke na-eji ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ. Kama na-emerenụ ibe ụnụ na mmadụ niile ezi ihe mgbe niile. Na-añụrịnụ ọñụ mgbe niile. Na-ekpekwanụ ekpere n’ewepụghị aka. Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihe ọ bụla. Nke a bụ ihe Chineke chọrọ na’aka ụnụ, ka ụnụ na-adị ndụ n’ime Kristi Jesu.
Ụnụ egbochila ọrụ nke Mmụọ Nsọ. Ụnụ elelikwala ibu amụma. Kama, nwaleenụ ihe niile nke ọma. Jidesienụ ezi ihe ike. Wepụnụ aka n’ihe ọjọọ n’ụdị ọ bụla.
Ka Chineke n’onwe Ya onye na-enye udo, doo ụnụ nsọ n’ụzọ niile. Ka O debezukwaa mmụọ ụnụ, na mkpụrụobi ụnụ, na ahụ ụnụ niile, ka a ghara inwe ihe a ga-eji ata ụnụ ụta mgbe Onyenweanyị Jesu Kristi ga-abịa. Chineke bụ onye na-akpọ ụnụ, kwesịrị ntụkwasịobi. Ọ ga-emezukwa ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU – Luk 4:18
Alleluịa, Alleluịa:
E nyela m mmụọ nke Onyenweanyị. O zipụla m ka m bugara ndị ogbenye Oziọma.
Alleluịa.
OZIỌMA – Jọn 1:6-8, 19-28
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. Ọ bịara ịgbara ìhè ahụ akaebe, ka mmadụ niile wee si n’aka ìhè ahụ nweta okwukwe. Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, kama ọ bịara ịgbara ìhè ahụ akaebe. Nke a bụ akaebe nke Jọn gbara: N’oge ahụ, ndị isi nke ndị Juu siri na Jerusalem zigara ya ndị nchụaja na ndị Livaị ka ha jụọ ya onye ọ bụ. Jọn wee kwuo ezi okwu, ọ gọghị agọ, kama o kwupụtara sị: “Abụghị m Kristi ahụ.”
Ha jụrụ ya sị: “Onye zi ka ị bụ? Ị bụ Ịlaịja”? Jọn wee zaa sị: “Mba, abụghị m ya.” Ha wee jụọ ya sị: “Ị bụ Onye Amụma Ahụ”? Ọ sị: “Mba”! Ha wee sị ya: “Gwanụ anyị onye ị bụ, ka anyị nwee ihe anyị ga-aza ndị zitere zitere anyị. Gịnị ka ị na-ekwu banyere onwe gị”?
Jọn wee sị: “Abụ m ìhè ahụ onye amụma Aịzaya kwuru sị: ‘Otu olu na-eti mkpu n’ọzara: Meenụ ụzọ Onyenweanyị ka ọ kwụrụ ọtọ.”
Ụfọdụ n’ime ha ka ndị Farisii zitere. Ndị a wee jụọ Jọn sị: “Gịnị mere i ji eme ndị mmadụ mmirichukwu, ma ọ bụrụ na ị bụghị Kristi ahụ, ma ọ bụ Ịlaịja; ị bụghịkwa Onye Amụma Ahụ”?
Jọn wee zaa ha sị: “Eji m mmiri eme ndị mmadụ mmirichukwu. Ma otu onye guzo n’etiti ụnụ, onye ụnụ na-amaghị. Ọ na-abịa n’azụ m. Ma ekwesịghị m ọ bụna ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ Ya.” Ihe ndị a mere na Betanị, n’ofe Jọdan, ebe Jọn nọ na-eme ndị mmadụ mmirichukwu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu