Ememme Nne Anyị Nwanyị nke Guadalupe
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Zac: 2:14-17 MA Ọ BỤ Rev: 11:19A; 12:1-6A, 10AB
-
Abụọma na azịza ya
Judit 13:18BCDE, 19
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk 1:26-38 MA Ọ BỤ Oziọma: Luk 1:39-47
IHE ỌGỤGỤ Mbụ:Zac: 2:14-17
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwukwo Zekaraịa
Tikuo egwu ọṅụ ma ṅụrịa, gị nwa agbọghọ Zaịọn! N'ihi na lee, m na-abịa ibiri n'etiti gị, ka Onyenwe anyị kwuru. Ọtụtụ mba ga-ejikọta onwe ha n'ebe Onyenwe anyị nọ n'ụbọchị ahụ, ha ga-abụkwa ndị m, m ga-ebirikwa n'etiti gị; gị ga-amatakwa na Onyenwe anyị nke igwe ndị agha zitere m n'ebe ị nọ. Onyenwe anyị ga-enweta Juda dị ka òkè Ya n'ala nsọ ahụ, Ọ ga-ahọrọkwa Jeruselem ọzọ. Dere du, mmadụ niile, n'ihu Onyenwe anyị! N'ihi na Ọ na-ebilite n'ebe obibi Ya dị nsọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MA Ọ BỤ
IHE ỌGỤGỤ Mbụ: Rev: 11:19A; 12:1-6A, 10AB
Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwukwo Mkpughe
E meghere ụlọ nsọ Chineke nke dị n'eluigwe, a hụkwara igbe ọgbụgba ndụ Ya n'ime ụlọ nsọ ahụ. Oke ihe ịrịba ama pụtara n'eluigwe: otu nwa agbọghọ onye anyanwụ yiri uwe, ọnwa dịkwa n'okpuru ụkwụ ya, n'elu isi ya kwa ka okpueze kpakpando iri na abụọ dị. Ọ dị ime, ọ nọkwa na-etiku mkpu n'ihe mgbu ka ọ na-adọbi ịmụ nwa. Ihe ịrịba ama ọzọ pụtakwara n'eluigwe; lee, otu nnukwu dragọn na-acha ọbara ọbara, nke nwere isi asaa na mpi iri, n'elu isi ya asaa kwa ka e doro okpueze asaa. Odudu ya zachara otu ụzọ n'ụzọ atọ nke kpakpando ndị dị n'eluigwe wee tụba ha n'ụwa. Dragọn ahụ guzooro n'ihu nwa agbọghọ ahụ na-aga ịmụ nwa, ka ọ rachaa nwa ya mgbe ọ mụrụ ya. Ọ mụrụ nwa nwoke, nwa nwoke a kara aka iji mkpanaka ígwè chịa mba niile. A napụtara nwa ya gaa n'ebe Chineke nọ na n'ocheeze Ya. Nwa agbọghọ ahụ n'onwe ya gbapụrụ gaa n'ọzara ebe Chineke doro ya ebe. M wee nụ oke olu n'eluigwe ka ọ na-asị: “Ugbu a ka nzọpụta na ike na Alaeze nke Chineke anyị na ikike nke Onye Ya tere mmanụ bịara.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA –Judit 13:18BCDE, 19
Azịza: Ị bụ oke nkwanye ùgwù nke agbụrụ anyị.
1. Ngọzi na-adịrị gị, nwa m nwanyị, site n'aka Chineke Nke kacha elu,
karịa ụmụ nwaanyị niile nọ n'ụwa;
ngọzi nọkwara n'ebe Onyenwe anyị Chineke nọ,
Onye kere eluigwe na ụwa.
Azịza: Ị bụ oke nkwanye ùgwù nke agbụrụ anyị.
2. Omume olileanya gị agaghị apụ n'uche ndị na-akọ akụkọ banyere ike nke Chineke.
Azịza: Ị bụ oke nkwanye ùgwù nke agbụrụ anyị.
Alleluia
R. Alleluia, alleluia.
Ngọzi na-adịrị gị, Virgin Maria dị nsọ,
onye kwesịrị otuto niile;
n'ime gị ka anyanwụ nke ikpe ziri ezi pụtara,
bụ Kraịst Onyenwe anyị.
R. Alleluia, alleluia.
Oziọma: Luk 1:26-38
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Chineke zitere mmụọ ozi Gebriel n'otu obodo dị na Galili a na-akpọ Nazaret, gaa n'ebe otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nọ, onye e kwere ná nkwa ọlụlụ n'aka otu nwoke aha ya bụ Jozef, onye ezinụlọ Devid, aha nwa agbọghọ ahụ bụ kwa Maria. Mgbe ọ bịakwutere ya, ọ sịrị: “Ekene, gị onye amara jupụtara! Onyenwe anyị nọ n'ebe ị nọ.” Ma ihe a e kwuru riri ya ọnụ, ọ na-eche n'obi ya ụdị ekene nke a nwere ike ịbụ. Mmụọ ozi ahụ wee sị ya, “Atụla egwu, Maria, n'ihi na ị hụrụ amara n'ihu Chineke. Lee, ị ga-atụrụ ime n'akpa nwa gị, mụọ nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha Ya Jizọs. Ọ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa Ya Nwa nke Onye kacha elu, Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze Devid bụ nna Ya, Ọ ga-achịkwa ezinụlọ Jekọb ruo mgbe ebighị ebi, Alaeze Ya agaghị enwekwa njedebe.” Ma Maria sịrị mmụọ ozi ahụ, “Gịnị ka ihe a ga-esi mee, ebe m na-amaghị nwoke?” Mmụọ ozi ahụ zara ya sị: “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kacha elu ga-ekpuchi gị. Ya mere nwa ahụ a ga-amụ ga-abụ onye nsọ, a ga-akpọ Ya Nwa Chineke. Lee kwa, Elizabet bụ onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke n'oge nká ya, nka bụkwa ọnwa nke isii n'ebe onye ahụ a na-asị na ọ bụ nwa n'adịghị nọ; n'ihi na ọ dịghị ihe ga-ara Chineke ahụ ime.” Maria wee sị, “Lee ohu nwaanyị nke Onyenwe anyị. Ka ọ dịrị m dịka okwu gị siri dị.” Mmụọ ozi ahụ wee hapụ ya gawa.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
MA Ọ BỤ
Oziọma: Luk 1:39-47
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Maria biliri n'ụbọchị ndị ahụ gaa n'ike n'ike n'ala ugwu, gaa n'otu obodo dị na Juda, ebe o banyere n'ụlọ Zekaraịa wee kene Elizabet. Mgbe Elizabet nụrụ ekene Maria, nwa ahụ nọ n'ime ya wụliri elu, Elizabet wee jupụta na Mmụọ Nsọ, o wee tie mkpu n'oké olu sị: “Ngọzi na-adịrị gị n'etiti ụmụ nwaanyị, ngọzi na-adịrị kwa mkpụrụ nke akpa nwa gị. Gịnị mere m ji nweta amara a, na nne Onyenwe m ga-abịakwute m? N'ihi na lee, ozugbo olu ekene gị ruru m na ntị, nwa nọ n'ime m wụliri elu maka ọṅụ. Ngọzi na-adịrị gị bụ onye kwere na ihe Onyenwe anyị gwara gị ga-emezu.” Maria wee sị: “Mkpụrụ obi m na-aja ịdị ukwuu nke Onyenwe anyị mma; mmụọ m na-aṅụrịkwa ọṅụ n'ime Chineke onye nzọpụta m.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu