Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rev: 10:8-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 119:14, 24, 72, 103, 111, 131.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 19:45-48
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rev: 10:8-11
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.
Olu nke ahụ m nụrụ mbụ si n’eluigwe daa gwakwara m ọzọ sị, “Gaa nara akwụkwọ mpịakọta ahụ nke ghere oghe n’aka mmụọọma ahụ nke debere otu ụkwụ n’elu oke osimiri, nke ọzọ n’elu ala.”
Agakwuuru m mmụọọma ahụ, gwa ya ka o nye m akwụkwọ mpịakọta ntakịrị ahụ. Mana ọ sịrị m: “Nara ya rie, ọ ga-elu ilu n’ime afọ gị ma ọ ga-atọ ka mmanụ añụ n’ọnụ gị.”
Anaara m mmụọọma akwụkwọ mpịakọta ntakịrị ahụ, rie ya; ọ tọrọ ka mmanụ añụ n’ọnụ m, mana mgbe m richara ya o luru m ilu n’afọ.
Ọ gwara m okwu ọzọ sị, “Ị ghaghị ibu amụma nye ọtụtụ agbụrụ, ọtụtụ mba, asụsụ dị icheiche na ọtụtụ ndị eze.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:14, 24, 72, 103, 111, 131.
Azịza: Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ n’ọnụ.
1.Ana m enwe añụrị n’iso iwu gị
Kama akụnụụba niile nke ụwa a.
Azịza: Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ n’ọnụ.
2. Iwu gị na-atọ m ụtọ
na-adụkwa m ọdụ.
Azịza: Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ n’ọnụ.
3. Iwu siri n’ọnụ gị pụta ka mma
Karịa puku kwuru puku ọlaọcha na ọlaedo.
Azịza: Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ n’ọnụ.
4. Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ,
ọ dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
Azịza: Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ n’ọnụ.
5. Iwu gị na-ewetara obi m añụrị,
ha bụ ihe nke m ketara ruo mgbe ebighịebi.
Azịza: Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ n’ọnụ.
6. Eghebere m ọnụ na-eku ume
N’ihina agụụ nke iwu gị.
Azịza: Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ n’ọnụ.
MBEKU – Jọn 14:5
Alleluịa, Alleluịa:
Atụrụ m na-anụ olu m, ka Onyenwe anyị kwuru; amara m ha, ha na-esokwa m.
Alleluịa.
OZIỌMA –Luk: 19:45-48
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu banyere n’ime ụlọnsọ Chineke malite ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa. Ọ gwara ha sị, “E dere ya, Ụlọ m ga-abụ ụlọ ekpere, ma ụnụ emegharịala ya ka ọ bụrụ ụlọ ndị ohi.
Ọ na-akuzikwa ihe ụbọchị niile n’ụlọnsọ. Ndịisi nchụaja, ndị ode-akwụkwọ na ndịisi nke ndị Juu nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, ma o nweghị ihe ha hụrụ ha nwere ike ime, n’ihina mmadụ niile kwenyere n’okwu ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu