Tuzde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rev: 3:1-6, 14-22.
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 15:2-3, 3-4, 5.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 19:1-10.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rev: 3:1-6, 14-22.
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.
Degara Mmụọọma nke na-edu nzukọ Kristi nke dị na Sadis akwụkwọozi sị, Nke a bụ ozi nke onye ahụ nwere Mmụọ asaa nke Chineke na kpakpando asaa ahụna-ezi gị.
Ama m ọrụ gị na otu e si enwere gị dịka onye dị ndụ, mana n’eziokwu ị nwụrụ anwụ. Bilie, mee ka ihe fọdụrụ n’ime gị, nke na-anwụbeghị kwusie ike tupu ha anwụọ kpamkpam; n’ihina achọpụtala m na ọrụ gị ezubeghị oke n’ihu Chineke m.
N’ihi nke a cheta ozi ị natara na otu i siri nụ ya, mezuo ya ma chegharịkwaa. Ọ bụrụ na ị naghị eche nche, aga m abịakwute gị na mberede dịka onye ohi.
Ị gaghị amatakwa oge m ga-abịakwute gị. Mana i nwere naanị mmadụ olemole na Sadis ndị na-emetọbeghị onwe ha.
Ha ga-eyi uwe ọcha ha na-eso m, n’ihina ha tozuru etozu. Onye ọbụla nwetara mmeri ka a ga-eyikwasị uwe ọcha. Agaghị m ehichapụ aha ya n’Akwụkwọ nke ndụ; aga m ekwupụta aha ya n’ihu Nna m, ya na n’ihu ndị mmụọọma.
Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ na-agwa nzukọ Kristi niile. Degara Mmụọọma ndị nzukọ Kristi dị na Laodishia akwụkwọozi si, Nke a bụ okwu nke onye ahụ bụ Amen, onye kwesịrị ntụkwasịobi, na-agbakwa akaebe eziokwu isi mbido nke ihe niile Chineke kere.
Amaara m ọrụ gị niile. I jụghị oyi nke ị na-ekpo ọkụ. Ọ gaara adị mma ma a sị na ị jụrụ oyi mọbụ na ị dị ọkụ! Ma ebe ị dị ñarañara, ị jụghị oyi nke ị na-ekpo ọkụ, aga m agbụpụ gị n’ọnụ m.
Ị na-akasị onwe gị obi sị, Abụ m ọgaranya, abakwara m ụba. Ọ dịghịkwa ihe ọbụla na-akpa m, ma ị maghị na ị nọ na nhụjuanya, i tosịrị imere ebere, ị dara ogbenye, i kpuru isi ma gbarakwa ọtọ.
N’ihi nke a, ana m adụ gị ọdụ ka i si n’aka m zuru ọlaedo a ñụchara n’ọkụ nke ọma, ka i wee baa ụba.
Zụrụkwa uwe ọcha kpuchie onwe gị ka aghara ịhụ mgbaramọtọ gị nke na-eweta ihere. Zụrụkwa ọgwụ tee n’anya gị ka i were na-ahụ ụzọ nke ọma.
Ndị m hụrụ n’anya ka m na-abara mba, na-atakwa ha ahụhụ n’ihi njọ ha. Ya mere, nweenụ ịnụ ọkụ n’obi, chegharịkwaa na mmehie ụnụ.
Lee eguzo m n’ọnụụzọ na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọbụla anụ olu m meghee ụzọ, aga m abịakwute ya soro ya rie ihe.
Ya onwe ya ga-esokwa m rie nri. Onye ọbụla meririnụ, aga m enye ya ike isoro m nọdụ ala n’ocheeze m, dịka mụ onwe m si merie soro Nna m nọdụ ala n’ocheeza ya. Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ na-agwa nzukọ Kristi niile.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 15:2-3, 3-4, 5.
Azịza: Onye ọbụla meririnụ aga m enye ya ike isoro m nọdụ ala n’ocheeze m.
1.Ọ bụ nwoke ahụ na-ebughị njọ ọbụla na ndụ ya,
onye na-eme ihe dị mma,
onye ji obi ya niile ekwu eziokwu.
Onye na-anaghị ekwutọ ndịọzọ.
Azịza: Onye ọbụla meririnụ aga m enye ya ike isoro m nọdụ ala n’ocheeze m.
2. Onye anaghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ;
Mọbụ bo ya ebubo asị.
Onye na-eleda ndị amaghị Chineke anya
ma na-enye ndị na-atụ Yahweh egwu nsọpụrụ.
Azịza: Onye ọbụla meririnụ aga m enye ya ike isoro m nọdụ ala n’ocheeze m.
3. Onye na-ebinye ego n’anaghị ọmụrụ nwa,
onye anaghị eri ngarị iji megide onye enweghị ihe ọjọọ o mere.
Ọ bụrụ na mmadụ e mee ihe ndị a
O nweghị ihe ọbụla ga-eme ka egwu tụọ ya.
Azịza: Onye ọbụla meririnụ aga m enye ya ike isoro m nọdụ ala n’ocheeze m.
MBEKU – 2 Thessa. 2:14.
Alleluịa, Alleluịa:
N’ihina Chineke hụrụ ụwa n’anya otu a, nke na o nyere sọ otu nwa ya ka onye ọbụla nke kwere na ya ghara ịla n’iyi kama ka o nwee ndụ ebeebe.
Alleluịa.
OZIỌMA –Luk: 19:1-10.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu banyere na Jeriko, na-achọ isi na ya gaa ebe ọzọ. Ma o nwere otu nwoke a na-akpọ Zacchaeus; nwoke a bụkwa onyeisi ọnaụtụ na nnukwu ọgaranya.
Ọ chọrọ ịhụ ma mata onye Jesu bụ. Mana o nweghị ike ime nke a n’ihi igwe mmadụ, maka na ọ dị mkpụmkpụ.
Nke a mere o jig baa ọsọ gaa n’ihu, rịgoro otu osisi a na-akpọ Sikamọ, ka o wee nwee ike ịhụ Jesu, maka na ọ ga-esi n’ụzọ ahụ gafee.
Mgbe Jesu bịaruru n’ebe ahụ, o leliri anya elu, hụ Zacchaeus sị ya, “Zacchaeus! Mee ngwa rịdata, n’ihi na aga m anọ n’ụlọ gị taa!”
O mekwara ngwangwa rịdata, were ọñụ nabata Jesu. Mgbe ndị mmadụ hụrụ nke a, ha niile tamuru ntamu sị: “Ọ banyela ịbụ onye ọbịa n’ụlọ onye omenjọ.
Zacchaeus guzooro, gwa Onyenweanyị sị: “Lee Onyenwe m, Aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile n nwere.
Ọ bụrụkwa na o nweela onye m naara ihe ya n’ụzọ aghụghọ, aga m akwụghachị ya ugboro anọ.”
Jesu gwara ya sị, ‘Nzọpụta abịaruola n’ụlọ a taa, n’ihina ọ bụkwazi nwa nke Abraham. N’ihina Nwa nke Mmadụ ahụ bịara ịchọpụta ma zọpụtakwa ndị furu efu.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu