Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rev: 1:1-4, 2:1-5
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 1:1-2, 3, 4, 6.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 18:35-43
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rev: 1:1-4, 2:1-5
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.
Mkpughe nke Jesu Kristi, nke Chineke nyere ya, iji gosị ụmụodibo ya, ihe ụfọdụ ga-emerịrị n’oge na-adịghị anya. Jesu mere ka odibo ya bụ Jọn mata ihe ndị a, site n’aka Mmụọọma ya nke o zigaara ya.
Jọn n’onwe ya kọrọ ihe niile ọ hụrụ,bịa site na ya gbaara okwu Chineke na ihe Jesu Kristi kwuru akaebe. Ngọzi dịịrị onye ọbụla na-agụpụta okwu amụma nke a!
Ngọzi dịkwara ndị niile na-anụ ya na-edebekwa ihe niile e dere n’ime ya n’ihina oge adịla nso!
Jọn degaara nzukọ asaa ndị dị n’Eshịa akwụkwọ sị: Amara na udo nke sitere n’aka onye ahụ dị adị, onye ahụ dịbu na mbụ na onye ahụ ga-abịanụ, ya na, site na mmụọ asaa ahụ ndị nọ n’ihu ocheeze Chineke.
Dee akwụkwọozi degaara Mmụọọma nke nzukọ Kristi nọ n’Efesọs: Nke a bụ ozi nke onye ahụ ji kpakpando asaa n’aka iri ya, na nke na-ejegharị n’etiti ihe ndọba oriọna asaa ahụ e ji ọlaedo mee na-ezi ụnụ.
Amaara m ọrụ gị niile, mgbalị gị na ndidi gị. Amaara m na ị naghị anabata ndị ihe ọjọọ, kama ị nwaleela ndị kpọrọ onwe ha ụmụazụ ma ha abụghị, wee chọpụta na ha bụ ndị okwu asị.
Amakwa m na ị na-enwe ogologo ndidi, na-anabata ihe niile n’ihi aha m. Ike agwụbeghịkwa gị.
Nke a bụ iwe m n’ebe ị nọ: ịhụnaanya gị n’ebe m nọ adịghịkwa ekpo ọkụ otu ọ dị na mbụ.
Cheta ebe dị elu nke i si na ya dapụ, chegharịa, na-arụkwa ọrụ gị dịka ị si arụ na mbụ. Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị bupụ ihe ndọba oriọna gị n’ọnọdụ ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 1:1-2, 3, 4, 6.
Azịza: Onye ọbụla nwetara mmeri, aga m ekwe ka ọ taa mkpụrụ osisi nke ndụ.
1.Aụrị ga-adịrị nwoke ahụ
nke anaghị eso ndụmọdụ onye ajọomume,
Mọbụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ
mọbụ nọdụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke;
Kama ọ na-enwe aụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị
ma na-achịgharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị.
Azịza: Onye ọbụla nwetara mmeri, aga m ekwe ka ọ taa mkpụrụ osisi nke ndụ.
2. Ọ dị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,
Nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya
nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ
Ihe niile ọ na-eme na agara ya nke ọma.
Azịza: Onye ọbụla nwetara mmeri, aga m ekwe ka ọ taa mkpụrụ osisi nke ndụ.
3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ;
Mba, n’ihina ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị.
N’ihina Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume
Mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n’ila n’iyi.
Azịza: Onye ọbụla nwetara mmeri, aga m ekwe ka ọ taa mkpụrụ osisi nke ndụ.
MBEKU – Jọn 8:12.
Alleluịa, Alleluịa:
Guzo nụ ọtọ ma welie isi unu elu, n’ihi na mgbapụta unu dị nso.
Alleluịa.
OZIỌMA –Luk: 18:35-43
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ka Jesu na-abịaru Jeriko nso, otu onye isi nọdụrụ ala n’akụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. Ọ nụrụ ụzụ igwe mmadụ ka ha na-agafe, o wee jụọ ihe kpatara ụzụ ji atụ.
Ha gwara ya sị, “Jesu onye Nazaret na-agafe!” O tiri mkpu sị, “Jesu, nwa Devid, meere m ebere!”
Ndị nọ n’ihu baara ya mba, na-agwa ya ka o mechie ọnụ; o tisikwara mkpu ike karịa sị, “Jesu nwa Devid, meere m ebere!”
Jesu kwụsịrị, nye iwu ka e dutere ya onye isi ahụ. Mgbe ọ bịaruru ya nso ọ jụọ ya sị: “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?”
Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, mee ka m hụkwa ụzọ ọzọ.” Jesu gwara ya sị: “Hụbakwa ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.”
O bidoro hụba ụzọ ozigbo, soro ya na-aga, na-eto Chineke. Ndị mmadụ niile hụrụ nke a, nyere Chineke otito.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu