Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jon: 1:5-8
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 112:1-2, 5-6, 8, 9.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 18:1-8
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Jon: 1:5-8
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jọn nke Atọ
Onye m hụrụ n’anya, ọ bụ ihe kwesịrị ntụkwasịobi ka ị na-eme, mgbe ị na-agbara ụmụnna anyị odibo, ọkachakwa ndị ọbịa; ndị gbara akaebe maka ịhụnanya gị n’ihu nzukọ.
Ọ ga-adị mma ka I dupụ ha, otu o kwesịrị ije ozi nke Chineke. Ha apụọla nje m maka Chineke, n’anaghịkwa ndị na-amaghị Chineke ihe onyinye ọbụla.
Anyị kwesịrị ịkwado ndị dị otu a, ka anyị nwee ike iso bụrụ ndị ọrụ n’ime eziokwu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 112:1-2, 5-6, 8, 9.
Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.
1. Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.
Onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!
Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,
agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi.
Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.
2. Ezinụụlọ ya ga-enweta akụnụụba,
eziomume ya agaghị enwe mgbanwe.
N’ihina onye ezigbo omume
ga-achawapụta dịka ihe n’etiti ọchịchịịrị,
ọ dị ebere, ịhụnaanya na-akwụba aka ọtọ.
Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.
3. Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego,
ọ bụ onye eziokwu n’ihe niile ọ na-eme.
Ebe eziomume chedoro ya, ọ na-enwe ịkwụdosike,
ọ na-ahapụ ncheta ga-adị ebeebe n’azụ ya.
Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.
MBEKU – Ps. 25: 4, 5.
Alleluịa, Alleluịa:
Kụziere m ụzọ gị, Onyenweanyị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.
Alleluịa.
OZIỌMA –Luk: 18:1-8
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ha ụkabụilu iji kuziere ha na ọ dị mkpa ka ha nọgide n’ekpere mgbe niile, ghara ịda mba.
Ọ gwara ha sị: “N’otu obodo, e nwere otu onye ọkaikpe nke na-anaghị atụrụ Chineke egwu, nke ọ na-asọpụrụ mmadụ ibe ya.
E nwekwara otu nwaanyị isimkpe bikwa n’obodo ahụ, onye na-abịakwute ọkaikpe a kwa mgbe kwa mgbe, na-arịọ ya sị, ‘kpepụta m n’aka onye iro m.’
Na mbụ onye ọkaikpe a achọghị ịnụ arịrịọ nwaanyị a. Ma o mesịrị tụgharịa obi sị, ‘Ọ bụ eziokwu na adịghị m atụ egwu Chineke, adịghị m asọpụrụ mmadụ, ma n’ihi nsogbu nwaanyị isimkpe a na-enye m, aga m ekpepụta ya.
Ọ bụrụ na m emeghị otu a, ọ ga-abịagide na-esogbu m, agaghị m ezuru ya ike.’” Onyenweanyị kwukwara sị, “Nụrụnụ ihe onye ọkaikpe a, nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi kwuru.
Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta onye nke ya, onye na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-egbu oge tupu ọ zọpụta ha?
Agwa m ụnụ, Ọ ga-ekpepụta ha ọsọọsọ. Ka o sila dị, mgbe nwa nke mmadụ ga-abịa Ọ ga-enwetekwa ndị nwere okwukwe n’elu ụwa?”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu