Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Tit: 3:1-7
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 23:1-3, 3-4, 5, 6.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 17:11-19.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Tit: 3:1-7
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara Taịtọs
Chetara ndị mmadụ ka ha na-erubere ndị nọ n’ọchịchị isi, dịkwa nkwadobe ịrụ ọrụ ọma ọbụla. Gwa ha ka ha ghara ikwutọ onye ọbụla, zere okwunụụka, dị ọgọ, na-akwanyekwara ndịọzọ ugwu.
Anyị onwe anyị bụ ndị nzuzu na mbụ, ndị isiike, ndị e duhiere ụzọ, ndị agụụ nke anụahụ na ihe ụtọ dị icheiche na-achị.
Na mbụ, anyị bi n’iro na ekworo. Ndị mmadụ kpọrọ anyị asị, anyị kpọkwara onwe anyị asị.
Oge obiọma na ịhụnaanya nke Chineke bụ onye Nzọpụta anyị pụtara ihe, ọ zọpụtara anyị. Ọ bụghị n’ihi ezi ọrụ ndị anyị rụrụ, kama ọ bụ site n’ebere ya, site na nsacha nke ọbara ya, nke Mmụọ Nsọ o ji amụ anyị ọzọ na nke o ji enye anyị ndụ ọhụrụ.
O nyere anyị Mmụọ Nsọ ahụ n’uju site n’onye Nzọpụta anyị bụ Jesu Kristi. Chineke mere nke a ka o nwee ike isi n’amara ya gụnye anyị na ndị eziomume, ka anyị nwee ike iketa ndụ ebighị ebi anyị na-ele anya ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 23:1-3, 3-4, 5, 6.
Azịza: Chineke bụ onyenche m, O nweghị ihe m ga-achọ.
1.Chineke bụ onyenche m O nweghị ihe m ga-achọ
Ọ na-eme ka m zuru ike ebe ahịhịa ndụ dị
Ọ na-eduga m na mmiri
Ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike.
Azịza: Chineke bụ onyenche m, O nweghị ihe m ga-achọ.
2. Ọ na-edu m n’ụzọ eziomume
n’ihi aha ya
Ọbụrụgodu na m na-aga na ndagwurugwu nke ọnwụ
egwu ọbụla agaghị atụ m
iji mkpara na ngu gị nọdebe m
Ọ bụ ha na-enye m agbamume.
Azịza: Chineke bụ onyenche m, O nweghị ihe m ga-achọ.
3. Ị na-akwadoro m nri.
n’ihu ndịiro m.
I teela isi m mmanụ
Iko m ejula n’ọnụ na-agbọfu.
Azịza: Chineke bụ onyenche m, O nweghị ihe m ga-achọ.
4. N’ezie obiọma na ebere ga na-eso m
ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke
Ebeebe ebeebe!
Azịza: Chineke bụ onyenche m, O nweghị ihe m ga-achọ.
MBEKU – Col 3:16, 17.
Alleluịa, Alleluịa:
Na-ekele nụ Chineke n'ọnọdụ niile, n’ihi na nka bụ uche Chineke n’ebe unu nọ n’ime Kraịst Jizọs.
Alleluịa.
OZIỌMA –Luk: 17:11-19.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ka Jesu na-aga Jerusalem, o sitere n’ụzọ dị n’agbata Sameria na Galili. Mgbe Ọ banyere n’otu ọnụmara, ndị ekpenta mmadụ iri kwụ n’ụzọ zutere ya.
Ha welitere olu tie mkpu sị, “Jesu, Nna anyị ukwu, meere anyị ebere.” Mgbe Jesu hụrụ ha, Ọ gwara ha sị, “Gaanụ gosị ndị ụkọchukwu onwe ụnụ.”
Ka ha na-aga e mere ka ahụ ha dị ọcha. Mgbe otu n’ime ha hụrụ na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chukwu.
Ọ bịara daa n’ụkwụ Jesu na-enye ya ekele. Nwoke a bụ onye Sameria. N’ihi nke a Jesu jụrụ sị, “Ọ bụ na ọ bụghị mmadụ iri ka a gwọrọ?
Kedụkwanụ maka mmadụ itoolu ndịọzọ? Ọ bụ na o nweghị onye n’ime ha lọghachiri azụ inye Chineke otito ma ọ bụghị onye mba ọzọ a?”
Jesu gwara ya sị, “Bilie, gawara onwe gị, okwukwe gị azọọla ga.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu