Ncheta Onye Nsọ Leo Ukwu, Nnukwu Ukochukwu na Dọkịta nke Ụka.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Tit: 2:1-8, 11-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 37:3-4, 18, 23, 27, 29.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 17:7-10
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Tit: 2:1-8, 11-14
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara Taịtus
N’akụkụ nke gị, na-akụzi akparamagwa kwesịrị eziokwu nke okwukwe. Gwa ndị okenye nwoke ka ha ghara ịdị na-emebiga ihe oke, ka ha sọpụrụ onwe ha, na-ebi ka ndị nwere akọnuuche, jide ezi okwukwe, nwee ịhụnaanya, kwụdosikwa ike.
N’otu aka ahụ, gwakwa ndị okenye nwaanyị ka ha na-ebi ndụ nsọpụrụ. Ka ha ghara ịdị na-agba asịrị mọbụ na-añụbiga mmanya oke, kama ka ha na-akụzi eziomume.
Ha ga-esi otu ahụ kuziere ụmụnwaanyị ndịọzọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha n’anya, bụrụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha, ndị na-eje ozi n’ụlọ, ndị na-erubere di ha isi, ka ndị mmadụ ghara oleli okwu Chineke.
N’otu aka ahụ, gwa ụmụokorobịa ka ha jide onwe ha. N’ihe niile ị na-eme, mee onwe gị onye ndịọzọ ga na-eñomi n’ezi omume.
Na nkuzi gị niile, gosịkwa izuoke na ikwesị ntụkwasịobi. Ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ na-apụghị ịgbagha, ka ihere wee mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na o nweghị ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị.
Chineke egosịpụtala amara ya iji wetara mmadụ niile nzọpụta. Amara ahụ na-akụziri anyị ka anyị jụ omume niile megidere ife Chineke, na ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa.
Ka anyị na-ejide onwe anyị aka, na-ebi ndụ eziomume na ndụ ịtụ Chineke egwu n’ụwa a. Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzi, bụ ọbịbịa nke otito nke Chineke anyị dị ukwu na onye Nzọpụta anyị bụ Jesu Krisiti.
O nyere onwe ya n’ihi anyị, iji zọpụta anyị na njọ niile, ka o wee wụchapụtara onwe ya ndị dị ọcha, ndị ọ na-anụ ọkụ n’obi ime eziomume.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 37:3-4, 18, 23, 27, 29.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
1.Tụkwasịobi gị n’Onyenweanyị, na-emekwa ihe ọma
Ka Ị wee biri n’ala ebe obibi gị ma nwee udo
Nwebe añụrị n’ime Onyenweanyị
ka O wee nye gị ihe obi gị na-achọ.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
2. Onyenweanyị na-echekwa ndụ ndị eziomume
ihe nketa ha ga-adịgide ebeebe;
Onyenweanyị na-eduzị onye eziomume ụzọ,
Meekwa ka ọ kwụsie ike na-enwe ọganiihu.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
3. Zere njọ ma mebe mma
Ka i wee nweta ụlọ dị ebeebe.
Ma ndị eziomume ga-ebi n’ala a
Ha ga-ebi na ya ebeebe.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
MBEKU – Jọn 17:17
Alleluịa, Alleluịa:
Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-edebe okwu m. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.
Alleluịa.
OZIỌMA –Luk: 17:7-10
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “O nwere onye n’ime ụnụ nke nwere nwodibo na-arụrụ ya ọrụ n’ubi, mọbụ na-azụrụ ya atụrụ, ga-agwa nwodibo ya mgbe o siri n’ugbo bata sị, ‘Bịa rie nri ozigbo?’
Ọ bụ na ọ gaghị agwa ya sị, ‘Kwadoro m nri anyasị, jikekwara onwe gị nke ọma ịgbara m odibo ruo mgbe m ga-ericha, ñụchaa.
E mechaa, ị ga-eri ma ñụkwaa nke gị.’ Ọ ga-ekele nwodibo ahụ n’ihina o mere ihe a gwara ya? Otu a ka ọ dị ebe ụnụ nọ.
Mgbe ọbụla ụnụ mechara ihe a gwara ụnụ, ụnụ ga-ekwu sị, ‘Anyị bụ ụmụodibo etosịghị etosị, ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ka anyị rụrụ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu