Ụka nke Iri Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ex: 22:20-26
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 17:2-4, 47, 51 Az. 2
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Thes: 1:5-10
- OziọmaMat: 22:34-40
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Ex: 22:20-26
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ
Akpagbukwala onye ọbịa. E megbukwala ya n’ihi na o nwere mgbe ụnụ bụ ndị ọbịa n’ala ljipt. E mejọkwala nwanyị isimkpe ma ọ bụ nwa enweghị nne na nna.
Ọ bụrụ na ụnụ emegbuo ha, ha bekuo M, n’ezie aga M anụ mkpu akwa ha. Oke iwe M ga-enwu ka ọkụ. Aga m eji mma agha egbu ụnụ. Mgbe ahụ ka nwunye ụnụ ga-abụ nwanyị isimkpe.
Ụmụ ụnụ aghọọ ndị na-enweghị nna. “Ọ bụrụ nwa-ogbenye si n’agbụrụ ndị nke M ka i binyere ego, a nakwala ya ọmụrụ nwa. A tụkwasala ya ụma. Ọ bụrụ akwa mgbochi onye agbata obi gị ka ị chịịrị n’agba ibe, hụkwa na chịghachiri ya azụ tupu anyanwụ adaa, n’ihi na, eleghị anya, o nwere ike bụrụ sọ otu akwa mgbochi ahụ ka o nwere iji kpuchie ahụ ya.
Ọ bụ gịnị ọzọ ka ọ ga-eji rahụ ụra? Ọ bụrụ na ya bekuo M, aga M anụkwa olu ya, n’ihi na abụ M onye obi ebere.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA –Ps: 17:2-4, 47, 51 Az. 2
Azịza: Onyenweanyị, Ị bụ ike m. Ahụrụ m Gị n’anya.
1. Onyenweanyị, Ị bụ ike m.
Ahụrụ m Gị n’anya.
Onyenweanyị, nkume m,
ụlọ igwe m na onye mgbapụta m.
Azịza: Onyenweanyị, Ị bụ ike m. Ahụrụ m Gị n’anya.
2. Chineke m, nkume m na-agbaga ọsọ ndụ,
nchedo m, mpi nzọpụta m,
ụlọ m na-agbakpu ezere isi m.
Etiri m mkpu sị: “Otito dịrị Onyenweanyị,”
e wee zọpụta m n’aka ndị iro m niile.
Azịza: Onyenweanyị, Ị bụ ike m. Ahụrụ m Gị n’anya.
3. Ogologo ndụ dịrị Onyenweanyị!
Ọ bụ ya bụ Nkume m!
Ebube na otiti dịrị Chineke onye nzọpụta m.
Ọ bụ Gị nyere eze Gị nnukwu mmeri,
bịakwa meere Onye i tere mmanụ amara.
Azịza: Onyenweanyị, Ị bụ ike m. Ahụrụ m Gị n’anya.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Thes: 1:5-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbọ Pọl dị asọ degaara Ndị Tesalonịka
Ụnụ hụrụ ụdị ndụ anyị biri, mgbe anyị na ụnụ nọ; ụdị ndụ ahụ anyị jiri kuziri ụnụ ihe. Nke mere ụnụ ji bụrụ ndị na-eso ụzọ anyị, na ụzọ Onyenweanyị.
Ọ bụ ya mere ụnụ ji were añụrị nke Mmụọ Nsọ nabata Oziọma, ọ bụrụgodụ mgbe ahụ ọnwụnwa dị iche iche gbara ụnụ gburugburu. Otu a ka ụnụ si bụrụ ndị anya na-ele, n’agbata ndị niile kwere ekwe dị na Masidonia na Akaya.
Ebe ọ bụ na site n’aka ụnụ ka okwu nke Onyenweanyị malitere ịgbasa, ọ bụghị sọ na Masidonia na Akaya niile; kama akụkọ banyere okwukwe ụnụ nwere na Chineke agazuola ụwa niile.
Ọ dịghị mkpa ka anyị kọwara ndị ọzọ banyere ya. Ọ bụ ndị ọzọ na-akọrọ anyị otu anyị si bido ọrụ n’etiti ụnụ; otu ụnụ si wepụ aka n’ikpere arụsị, mgbe a tọghatara ụnụ na Chineke; na otu ụnụ si bịa bụrụ ụmụ odibo ezi Chineke dị ndụ; na otu o si bụrụ na ugbu a, ụnụ na-eche Jesu Nwa Ya, Onye O bilitere n’ọnwụ, ka O si n’eluigwe bịa zọpụta anyị na mmegwata ahụ na-abịanụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU – Luk. 19, 28
Aleluya, aleluya!
Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-edebe okwu m. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.
Aleluya!
OZIỌMA –Mat: 22:34-40
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe ndị Farisii nụrụ na Jesu emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha zukọtara ịchọpụta ajụjụ ọzọ ha ga-ajụ ya. Otu onye n’ime ha bụ onye ozizi iwu bịara jụọ Jesu ajụjụ iji nwaa ya sị, “Onye ozizi, olee iwu kachasị mkpa n’ime iwu niile?”
Jesu zara sị ya, “Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị n’anya site n’obi gị niile na site na mkpụrụ obi gị niile, na site n’uche gị niile. Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile.’
Iwu ọzọ na-eso nke a n’ịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka i si hụ onwe gị n’anya. Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma chọrọ ka ụnụ mee dabeere n’ebe iwu abụọ ndị a dị."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu