Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Eph: 3:2-12.
-
Abụọma na azịza ya
Aịzaya 12:2-3, 4, 5-6.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 12:39-48
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Eph: 3:2-12.
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Efesọs.
O doro m anya na ụnụ anụla na Chineke, site n’amara ya, enyela m ọrụ ilekọta ezinụụlọ ya nya maka ọdịmma ụnụ; otu e siri mee ka m mata ihe omimi ahụ site na mkpughe, dịka m dere ya nwantịntị.
Mgbe ụnụ gụrụ nke a, ụnụ ga-achọpụta nghọta m banyere ihe omimi nke Kristi, nke e meghị ka ụnụ mmadụ mara n’ọgbọ gara aga dịka Mmụọ Nsọ siri kpugheere ya ụmụazụ na ndịamụma ya dị asọ ugbu a.
Otu a ka ndị mba ọzọ si soro anyị bụrụ ndị nketa, ndị otu ahụ na ndị ga-eketa nkwa ahụ n’ime Jesu Kristi, site n’oziọma.
N’ihina oziọma a, e mere m onye ozi dịka onyinye amara nke Chineke siri dị, nke e nyere m site n’ọrụ nke ike ya.
N’ebe m nọ, n’agbanyeghị na m kacha dị nta n’etiti ndị nsọ niile, e nyere m ngọzi nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ enweghị atụ nke juru n’ime Kristi;
mekwaa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmaatụ nke ihe omimi e zoro n’ime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ.
Site na nzukọ ahụ, a ga-eme ka amamiihe Chineke n’ụdị ya dị icheiche bụrụ ihe ọchịchị na ike niile nke dị n’eluigwe ga-amata.
Nke a bụ n’usoro nke atụmaatụ ya dị ebeebe, nke e mezuru n’ime Jesu Kristi Dinwenụ anyị; bụ onye anyị nwere ntụkwasịobi na obi siri ike ịbịakwute site n’okwukwe anyị nwere na ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Aịzaya 12:2-3, 4, 5-6.
Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmi nke nzọpụta.
1. Lee, Chineke bụ onye nzọpụta m;
enwere m nchekwube, egwu agaghị atụ m;
N’ihina Yahweh Chineke bụ ike m na ukwe m,
ọ bụ onye nzọpụta m.
Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmi nke nzọpụta.
Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmi nke nzọpụta.
2. Nyenụ Chineke ekele kpọkuonụ aha ya,
Meenụ ka a mata aka ọrụ ya n’ebe mba niile nọ,
Kwupụtanụ na aha ya dị elu.
Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmi nke nzọpụta.
3. Bụọrọnụ Yahweh abụ ọma, n’ihina ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube;
meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile.
Tisienụ mkpu ike kweenụ ukwe ọñụ ụnụ ndị bi na Zayọn,
N’ihina onye nọ n’etiti ụnụ
bụ nnukwu onye dị nsọ nke Izrel.
Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmi nke nzọpụta.
MBEKU – Ps. 119:135
Alleluịa, Alleluịa:
Mụrụnụ anya! N’ihi na unu amaghị mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa.
Alleluịa.
OZIỌMA –Luk: 12:39-48
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma matanụ nke a, ọ bụrụ na nna nwe ụlọ matararị oge elekere onye ohi ga-abịa, ọ ga na-eche nche, ọ gaghị ahapụ ụlọ ya ka onye ohi gwupuo ya.
Ụnụ ga-adịkwa njikere n’ihina Nwa nke mmadụ na-abịa n’oge ụnụ atụghị anya.” Pịta jụrụ sị, “Dinwenụ ọ bụ naanị anyị ka I ji ụkabụilu a agwa okwu, ka ọ bụ maka onye ọbụla?”
Ma Dinwenụ zara sị, “Onye bụ nwodibo ahụ kwesịrị ntụkwasịobi, nwekwaa uche, onye nke nna ya ukwu ga-enye ike ilekọta ezinụụlọn ya anya, ka ọ na-enye ha oke nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?
Ngọzi na-adịrị nwodibo ahụ onye, mgbe nna ya ukwu ga-abịa, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otu a.
N’ezie agwa m ụnụ, nna ya ukwu ga-eme ya onye nlekọta nke ihe niile o nwere. Kama, ọ bụrụ na nwodibo ahụ echee n’obi ya sị, Nna m ukwu anọọla ọdụ na mbata, wee bido iti ụmụodibo ndị nwoke na ndị nwaanyị ihe,
na-eri na-añụkwa, mmanya ana-egbu ya, nna ya ukwu ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya n’oge elekere ọ na-amaghị.
Ọ ga-ata ya ahụhụ, tinyekwa ya n’ebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasịobi na-anọ. Odibo ahụ nke maara ihe nna ya ukwu na-achọ, mana ọ dịghị njikere ime ya,
o meghịkwa dịka ọchịchọ nna ya ukwu sị dị, ga-anata ọtụtụ ụtalị. Ma nwodibo nke na-amaghị ma mee ihe kwesịrị ịpịa ụtalị ga-enweta ụtalị olemole.
Onye ọ bụla nke e nyere ihe ukwu, a ga-achọkwa ihe ukwu n’aka ya; onye ndị mmadụ nyekwara ihe ukwu n’aka, n’aka ya ka ha ga-achọ ihe nke kanụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu