Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gal: 5:1-6
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 119:41, 43, 44, 45, 47, 48.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 11:37-41
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Gal: 5:1-6
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Galeshịa
Anyị enwerela onwe anyị n’ihina Kristi agabpụtala anyị n’ohu. Ya bụ kwụdosienụ ike dịka ndị nwerela onwe ha.
Ugbu a, mụ bụ Pọl na-agwa ụnụ sị; “Ọ bụrụ na ụnụ anabata ibi ugwu, Kristi abaghịrị ụnụ uru ọbụla.
Ọzọ ana m ekwupụta na onye ọbụla ga-anabata ibi ugwu ji ụgwọ idebezu iwu ahụ. E kewapụla ụnụ n’ebe Kristi nọ ụnụ ndị a ga-agụnye na ndị eziomume site n’iwu.
Ụnụ adapụla n’amara nke Chineke. N’ihina anyị onwe anyị nwere olileanya na site n’ike nke Mmụọ Nsọ, a ga-agụ anyị na ndị eziomume site n’okwukwe anyị.
N’ime Jesu Kristi obibi ugwu mọbụ ebighị ugwu abaghị uru ọbụla, kama okwukwe na-arụsi ọrụ ike site n’ịhụnaanya.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:41, 43, 44, 45, 47, 48.
Azịza: Onyenweanyị kwe ka ịhụnaanya nke ikwụdosiike gị bịakwate m.
1. Kwe ka ịhụnaanya nke ịkwụdosiike gị bịakwute m O Onyenweanyị,
ya na nzọpụta gị dịka I siri kwe na nkwa.
Azịza: Onyenweanyị kwe ka ịhụnaanya nke ikwụdosiike gị bịakwate m.
2. Anapụla m eziokwu gị,
N’ihina nchekwube m dị n’iwu gị.
Azịza: Onyenweanyị kwe ka ịhụnaanya nke ikwụdosiike gị bịakwate m.
3. Aga m na-edobe iwu gị mgbe niile,
Ebeebe, ebeebe.
Azịza: Onyenweanyị kwe ka ịhụnaanya nke ikwụdosiike gị bịakwate m.
4. Mgbe ahụ aga m ebi ndụ nke onye nweere onwe ya,
N’ihina iwu gị bụ ihe m na-achọ.
Azịza: Onyenweanyị kwe ka ịhụnaanya nke ikwụdosiike gị bịakwate m.
5. N’ihi ana m enwe añụrị n’iwu gị,
nke m hụrụ n’anya nke ukwuu.
Azịza: Onyenweanyị kwe ka ịhụnaanya nke ikwụdosiike gị bịakwate m.
6. Ana m asọpụrụ iwu gị niile nke m hụrụ n’anya,
na-achịgharịkwa ya n’ime obi m.
Azịza: Onyenweanyị kwe ka ịhụnaanya nke ikwụdosiike gị bịakwate m.
MBEKU – Ps. 27: 11
Alleluịa, Alleluịa:
Okwu Chineke na-adị ndụ, nweekwa ike; ọ na-atụle echiche na ebumnobi nke obi.
Alleluịa.
OZIỌMA –Luk: 11:37-41
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka Jesu na-ekwu okwu, otu onye Farisii kpọrọ ya oku oriri. Ọ banyere, nọrọ n’oche nri. Ọ gbagwojuru onye Farisii ahụ anya ịhụ na Jesu ebughị ụzọ kwọọ aka ya tupu o ribe ihe.
Ma Dinwenụ sịrị ya, “Ụnụ ndị Farisii na-asacha azụ iko na azụ efere, ma n’ime ya, ụnụ jupụtara n’anyaukwu na obiọjọọ.
Ụnụ ndị nzuzu! Ọ bụ na ọ bụghị onye ahụ mere azụ iko mekwara ime ya? Kama werenụ ihe ndị ahụ dị n’ime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara ụnụ ọcha.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu