Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gal: 3:22-29
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 105: 2-3, 4-5, 6-7
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 11:27-28
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Gal: 3:22-29
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Galeshịa.
Mana Akwụkwọ Nsọ edobela ihe niile n’okpuru njọ ka e wee nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha n’ime Jesu Kristi.
Ugbu a, tupu okwukwe abịa, anyị niile nọ n’okpuru iwu, a machibidoro anyị niile ruo mgbe a ga-ekpughere anyị okwukwe.
Ya bụ na iwu ahụ bụ onye nlekọta anyị ruo mgbe Kristi bịara, ka e wee gụnye anyị na ndị eziomume site n’okwukwe.
Mana ugbu a okwukwe bịara, anyị anọghịkwa n’okpuru onye nlekọta ahụ bụ iwu; n’ihina n’ime Jesu Kristi ụnụ niile bụ ụmụ Chineke site n’okwukwe.
Ka ụnụ niile ha, bụ ndị e mere mmirichukwu n’ime Kristi eyikwasala Kristi dịka uwe.
Nkewa nke na-adịbu n’etiti ndị Juu na ndị Grik, n’etiti ndị ohu na ndị nwe onwe ha, n’etiti ụmụnwoke na ụmụnwaanyị, apụghị ịchịkwa ọzọ n’ihina ụnụ niile bụ otu n’ime Jesu Kristi.
Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị nke Kristi ụnụ bụkwa ụmụ Abraham ndị ga-eketa ihe e kwere na nkwa.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105: 2-3, 4-5, 6-7
Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebighịebi ebighịebi.
1. Kweerenụ ya ukwe kụọrọnụ ya egwu
Kwupụtanụ ọrụ ịtụnanya ya niile!
Nwebenụ añụrị n’aha nsọ ya
Ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa.
Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebighịebi ebighịebi.
2. Chọbanụ Onyenweanyị na ike ya
Chọbanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile
Chetanụ ọrụ ebube niile ọ rụrụ
ọrụ ịtụnanya ya niile na ikpe niile si n’ọnụ ya pụta.
Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebighịebi ebighịebi.
3. Ụnụ ụmụ Abraham bụ nwodibo ya
ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!
Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị
Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile.
Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebighịebi ebighịebi.
MBEKU – Luk 8:15
Alleluịa, Alleluịa:
Ha nwere isi ọma bụ ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Luk: 11:27-28
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe Jesu na-ekwu okwu ndị a, otu nwaanyị si n’etiti igwe mmadụ ahụ welie olu sị, “Ngọzi na-adịrị afọ nke mụrụ gị na ara Ị ñụrụ!”
Ma Jesu zara sị, “Ngọzi na-adịrị ha karịa, bụ ndị nụrụ okwu Chineke dobekwa ya!”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu