Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ecl: 3:1-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 114:1-2, 3-4.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 9:18-22
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Ecl: 3:1-11
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ecclesiastes
Ihe ọbụla n’okpuru eluigwe nwere oge, e nwere oge maka ọrụ ọbụla. Oge ọmụmụ nwa na oge onwụ; oge ọkụkụ ihe ubi na oge owuwe ya; Oge igbu egbu na oge ọgwụgwọ, oge ntikpọ na oge mwulite.
Oge ibe akwa na oge ịchị ọchị; oge iru ụjụ na oge ịgba egwu; Oge ịtụfụ okwute ntụtụkọta okwute; mgbe e ji obiọma na mgbe e jịghị obiọma.
Mgbe e ji achọ ihe na e ji atụfụ, oge ndozi na oge ntufu. Oge ndọkwa na oge ndụkọta; oge ịgba nkịtị na oge ikwu okwu.
Oge ịhụnanya na oge ịkpọasị; oge ọgụ na oge udo. Kedụ uru onyeọrụ nwere na ndọlị ya? Ahụla m ọrụ nke Chineke nyere ụmụmmadụ ka ha na-arụ.
O meela ihe ọbụla ka ọ dị mma n’oge ya. Nke ọzọ, o meela ka mmadụ mata ihe bụ ebighịebi ma nke a emeghị ka mmadụ chọpụta ihe Chineke megorori site na mbido ruo na ngwụcha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 114:1-2, 3-4.
Azịza: Ngọzị dịrị Osebụrụwa, nkume m.
1. Ngọzị dịrị Osebụrụwa nkume m
ọ bụ ya bụ ịhụnanya m na onye nkwado m
ụlọ mgbaba m na onye nzọpụta m
ọ bụ na ya ka m na-ezo onwe m ekpeke m.
Azịza: Ngọzị dịrị Osebụrụwa, nkume m.
2. Osebụrụwa gịnị ka mmadụ bụ I ji na-eleta ya anya?
Nwa nke mmadụ nke I ji na-elekọta ya anya?
Ndụ mmadụ dịka otu nkume
ụbọchị ndụ ya niile dịkwa ka onyinyo.
Azịza: Ngọzị dịrị Osebụrụwa, nkume m.
MBEKU – 1 Thess. 2:13
Alleluịa, Alleluịa:
Nwa nke Mmadụ abịaghị ka e jere Ya ozi, kama ka Ọ jee ozi, na inye ndụ Ya ka Ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Luk: 9:18-22
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
O ruo mgbe Jesu nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Jesu jụọ ha sị, “Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na m bụ?”
Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Jọn onye na-eme mmirichukwu. Ụfọdụ na-asị na ị bụ Elaịja, ụfọdụ ndị ọzọ na-ekwukwa na out n’ime ndị amụma mgbe ochie esila n’ọnwụ bilie.”
O wee jụọ ha sị, “Ma onye ka ụnụ na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kristi nke Chukwu.”
Ma Jesu dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka na ntị, nyesie ha iwu ike ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe a, sị, “Nwa nke mmadụ ahụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ.
Ndị okenye ndị Juu, na ndịisi nchụaja, na ndị odeakwụkwọ ga-ajụ ya. A ga-egbukwa ya, na n’ụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu