Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1Cor: 10:14-22
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 116:12-13, 17-18
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 6: 43-49
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –1Cor: 10:14-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl Degaara ndị Kọrịnt
N’ihi ya, ndị m hụrụ n’anya, zerenụ ikpere arụsị. Ana m agwa ụnụ okwu dịka ndị nwere uche. Tụleenụ n’onwe ụnụ ihe m na-ekwu.
Ike nke ngọzi anyị na-agọzi n’oriri Nsọ, ọ bụghị inwekọ na ịñụkọ ọbara Kristi n’otu? N’ihina otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, n’ihina anyị niile na-eketa oke n’otu ogbe achịcha ahụ.
Chetanụ ka ndị Izrel mgbe ochie siri mee. Ọ bụ ndị na-eri ihe e jiri chụ aja abụghị ndị nnwekọ n’ebe nchụaja? Gịnịkwanụ bụ isi okwu m?
Ma arụsị, mọbụ ihe a chụrụ n’aja nye arụsị, bụ ihe ọbụla, mọbụ na ọ bụghị ihe? Mba! Kama ihe m na-ekwu bụ nke a: Na ihe ndị na-ekpere arụsị na-achụ n’aja bụ ndị mmụọ ọjọọ ka ha na-achụnyere, ọ bụghị Chineke.
Achọghị m ka ụnụ na ndị mmụọ ọjọọ nwee mmekọ. Ụnụ ekwesịghị ịñụ iko Dinwenụ ma na-añụkwa nke ndị Mmụọ ọjọọ. Anyị ga-akpasu Dinwenụ iwe? Ike anyị ọ karịrị nke ya?
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 116:12-13, 17-18
Azịza: Onyenweanyị, Aga m achụrụ gị aja ekele.
1. Kedụ ihe m ga-enye Onyenweanyị
Maka iheọma niile o meere m.
Aga m ebuli iko nzọpụta,
Wee kpọkuo aha nke Onyenweanyị.
Azịza: Onyenweanyị, Aga m achụrụ gị aja ekele.
2. Aga m achụrụ gị aja ekele
Wee kpọkuo aha nke Onyenweanyị
Aga m emejupụta nkwa m kwere Onyenweanyị,
n’ihu ndị nke ya niile.
Azịza: Onyenweanyị, Aga m achụrụ gị aja ekele.
MBEKU – 1 Pita 1:25
Alleluia, Alleluia:
Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-edebe okwu m. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.
Alleluia
OZIỌMA –Luk: 6: 43-49
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Osisi ọma anaghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọzọkwa osisi ọjọọ anaghị amị mkpụrụ ọma. Maka na a na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya.
N’ihina a naghịkwa aghọta ụdara n’osisi ogwu; a naghịkwa aghọta ụtụ n’osisi uke. Ezigbo mmadụ na-esite n’iheọma jupụtara ya obi na-eme iheọma, ma ajọ mmadụ, site n’ihe ọjọọ juru ya ahụ na-eme ihe ọjọọ, n’ihina site n’ọnụ ka e ji ekwupụta ihe juru n’obi.
Gịnị mere ụnụ ji akpọ m Dinwenụ m, Dinwenụ m, ma ụnụ anaghị eme ihe m gwara ụnụ? Onye ọbụla nke na-abịakwute m, na-anụ okwu m, ma na-emekwa ha, aga m ezi ụnụ ihe onye ahụ dịka ya.
Ọ dị ka otu nwoke wuru ụlọ, nke gwuru ala gwubaa ya n’ime, tọọ ntọala ya n’elu nkume; ma mgbe idemmiri bịara, mmiri ahụ wụkwasara ụlọ ahụ, ma ọ kwadalịghị ya, n’ihina e wuru ya nke ọma.
Ma onye na anụ okwu m niile na-anaghị eme ha dịka nwoke wuru ụlọ n’elu uzuzu na-atọghị ntọala, e mechaa mmiri iyi asọkwasa ya, ozigbo ụlọ ahụ wee daa, ọdịda ya dị egwu
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu