Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1Cor: 8:1-7, 11-13
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 139:1-3, 13-14, 23-24
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 6: 27-38
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –1Cor: 8:1-7, 11-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Ugbu a banyere ihe ụnụ jụrụ gbasara nri a chụnyeere arụsị: anyị ma nke ọma na “anyị niile nwere mmụta.” Mmụta na-afụli mmadụ elu, ebe ịhụnaanya na-azụlite mmadụ.
Ya bụ, onye ọbụla na-eche na ya maara ihe, amatabeghị dịka o kwesịrị ịma. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ Chineke n’anya, Chineke na-amata onye ahụ n’ụzọ dị iche.
Banyere okwu iri ihe a chụrụ n’aja nye arụsị, anyị maara nke ọma “na ọ dịghị arụsị ọbụla dị ndụ n’eziokwu.” Anyị makwa nke ọma “na ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ, ma ọ bụghị naanị otu.”
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ụmụ arụsị dị n’eluigwe na n’elu ụwa, ndị ụmụ mmadụ na-akpọ chi. Ọtụtụ “ndị bụ chi” na ọtụtụ “ndị nwe mmadụ” dịkwa.
Ma n’ebe anyị nọ naanị otu Chineke dị, bụ nna, onye ihe niile sitere n’aka ya; onye anyị onwe anyị na-adịrị ndụ.
Otu Dinwenụ anyị bụ Jesu Kristi, dịkwa, onye ihe niile sitere n’aka ya, onye anyị sitekwara na ya adị ndụ. Otu ọ dị, ọ bụghị mmadụ niile nwere ụdị nghọta nke a.Ụfọdụ ndị ihe gbasara arụsị maara ahụ na-eri nri ndị a dịka a chụụrụ ya arụsị n’eziokwu; ma ebe ọ bụ na akọnuuche ha adịghị ike, ha na-emerụkwa ya.N’ụzọ dị otu a, nwanna gị na-adịghị ike, onye Kristi nwụrụ n’ihi ya ewee site n’ihe mmụta gị laa n’iyi. Mgbe ọbụla ụnụ na-emehie megide ụmụnna ụnụ, na-emerụ akọnuuche ha, ụnụ na-emehie megide Kristi.N’ihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m dahie n’okwukwe ya, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m dahie.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 139:1-3, 13-14, 23-24
Azịza: Onyenweanyị, dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
1. Onyenweanyị i nyochaala m marakwa m!
Ị ma mgbe m nọdụrụ ala na mgbe m kwụ ọtọ;
ị na-anọ ebe dị anya mara ihe m bu n’uche
Ị mazuru omume m niile, mgbe m na-arụ ọrụ mọbụ mgbe m na-ezu ike.
Azịza: Onyenweanyị, dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
2. Ọ bụ gị kere mmụọ m
Ọ bụkwa gị kpụrụ m n’afọ nne m
Ana m ekele gị maka ihe omimi ndị a,
Maka ihe ịtụnaanya dị n’okike i kere m,
nakwa ihe ebube dị n’aka ọrụ gị niile.
Azịza: Onyenweanyị, dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
3. Chineke nyochaa m ka ị mara obi m!
nyochaa m ka ị chọpụta echiche m na-eche!
Ekwekwala ka m soro ụzọ ọjọọ,
na-edu m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
Azịza: Onyenweanyị, dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
MBEKU – Jọn 14:23
Alleluia, Alleluia:
Ọ bụrụ na anyị hụrịtara onye ọ bụla n’anya, Chineke na-ebi n’ime anyị, ịhụnanya Ya emezuokwa n’ime anyị.
Alleluia
OZIỌMA –Luk: 6: 27-38
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma ana m agwa ụnụ ndị na-anụ okwu m, hụnụ ndịiro ụnụ n’anya, meerenụ ndị kpọrọ ụnụ asị iheọma.
Ma na-agọzinụ ndị na-abụ ụnụ ọnụ, kpeerenụ ndị na-akparị ụnụ ekpere. Ọ bụrụ na onye ọbụla amaa gị ụra n’otu ntị, tụgharịara ya ibe ntị gị nke ọzọ.
Ọzọkwa, ọ bụrụ na onye ọbụla azọrọ gị uwe I yi n’ime, hapụkwara ya uwe mwụda gị. Nye onye ọbụla na-arịọ ihe n’aka gị.
Ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ihe gị ụfọdụ n’aka ike, ajụla maka ya ọzọ. Na-emesonụ ndị mmadụ omume otu ụnụ ga-achọ ka ha meso ụnụ.
Ọ bụrụ na ndị ụnụ na-ahụ n’anya bụ naanị ndị hụrụ ụnụ n’anya, olee oke ihe otito ụnụ nwere n’ime ya? N’ihina ọ bụladị ndị omenjọ nwere ịhụnaanya n’ebe ndị hụrụ ha n’anya nọ.
Ọ bụrụ na ụnụ emee iheọma nye naanị ndị meere ụnụ iheọma, olee oke ihe otito ụnụ nwere n’ime ya? N’ihina ọ bụladị ndị omenjọ na-eme otu ahụ.
Ọ bụrụ na ndị ụnụ na-ebinye ihe bụ naanị ndị ụnụ nwere olileanya na ụnụ ga-anata n’aka ha, olee oke ihe otito ụnụ nwere n’ime ya?
Ọ bụladị ndị omenjọ na ebinye ndị omenjọ ibe ha ihe, nwere olileanya na ha ga-anataghachi ihe ha binyere.
Kama, hụnụ ndịiro ụnụ n’anya, mekwanụ iheọma, binyekwanụ mmadụ ihe, na-achọghị ọmụrụnwa, ụgwọ ọrụ ụnụ ga-ebu ibu, ụnụ ga-abụ ụmụ nke onye kacha dị elu.
N’ihina O nwere obiọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma ndị nwere obi ekele ma ndị na-achọ naanị nke onwe ha.
Nweenụ obi ebere dịka Nna ụnụ nke eluigwe si nwee obi ebere. Ụnụ ekpela mmadụ ibe ụnụ ikpe ka a ghara ikpe ụnụ ikpe.
Ụnụ amakwala mmadụ ibe ụnụ ikpe ka a ghara ịma ụnụ ikpe, nweenụ obi mgbaghara ka e wee gbaghara ụnụ.
Gbasapụnụ aka nye, Chineke ga-enyeghachikwa ụnụ. Ọ ga-ebunye ụnụ iheọma n’akpa buru ibu, nke ayọgharịrị ihe dị n’ime ya, sụjue ya n’ọnụ, nke iheọma jupụtara, na awụpụ.
Chineke ga-adọba iheọma n’apata ụkwụ ụnụ abụọ. N’ihina ụdị akpa ụnụ ji tụnyere ndịọzọ ka a ga-eji tụnyere ụnụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu