Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ez: 43:1-7
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 85:8, 9, 10-11, 12-13
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMat: 23:1-12
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Ez: 43:1-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel
Ka e mechara o dutere m n’ọnụụzọama nke ahụ chere ihu n’ọwụwa anyanwụ. N’ebe ahụ ahụrụ m ebube Chineke nke Izrel ka o si n’ọwụwa anyanwụ, bịa, ụdị nke ọbịbịa ya dịka mkpọtụ nke osimiri, elu ụwa na-amụke n’ebube ya.
Ọhụ a m hụrụ dịka nke ahụ m hụrụ mgbe Ọ bịara imebi obodo ahụ ma dịkwa ka ọhụ nke ahụ m hụrụ n’akụkụ osimiri Keba; adara m n’ala n’ihu ya wee kpudo ihu m n’ala.
Mgbe ebube nke Dinwenụ sichara n’ọnụụzọama dị n’ọwụwa anyanwụ bata n’ime ụlọnsọ, mmụọ ahụ wee bulite m elu, kpọbata m n’obi nke dị n’ime; m hụ ka ebube nke Yahweh jupụtara ụlọnsọ niile.
Ka nwoke ahụ guzo n’akụkụ m, anụrụ m onye si n’ime ụlọnsọ gwa m okwu. Ọ sị m, nwa nke mmadụ, ebe a bụ ọnọdụ ocheeze m na ebe ndokwasị ụkwụ m, ebe m ga-ebinyere ụmụ Izrel ebeebe.
Ụlọ nke Izrel agaghịkwa emetọ aha nsọ m ọzọ, ma ha ma ndị eze ha site n’adịghị ọcha ha na ife chi ndị ọzọ nakwa site n’ozu ndịeze ha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 85:8, 9, 10-11, 12-13
Azịza: Ebube nke Onyenweanyị ga-anọgide n’ala anyị.
1. Ana m ege ntị n’ihe Chineke Onyenweanyị na-ekwu,
ihe ọ na-ekwu bụ udo maka ndị nke ya,
N’ezie nzọpụta ya dị nsọ maka ndị na-atụrụ ya egwu,
ka ebube ya wee nọgide n’ala anyị.
Azịza: Ebube nke Onyenweanyị ga-anọgide n’ala anyị.
2. Ịhụnaanya na okwukwe amakụọla,
eziomume na udo ebiela ọma
Irubeisi ga-esi n’ala pulite,
eziomume ga-esi n’elu ledata anya.
Azịza: Ebube nke Onyenweanyị ga-anọgide n’ala anyị.
3. Ee, Onyenweanyị ga-enye anyị ọganịihu,
ala anyị ga-amịta mkpụrụ bawanye.
Eziomume ga-aga n’ihu ya
udo ga na-eso nzọ ụkwụ ya.
Azịza: Ebube nke Onyenweanyị ga-anọgide n’ala anyị.
MBEKU – Jọn 15:15
Alleluia, Alleluia:
Naanị otu Nna ka unu nwere n'eluigwe; naanị otu onye nkụzi ka unu nwere, onye ahụ bụ Kraịst.
Alleluia
OZIỌMA –Mat: 23:1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara igwe mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ n’ọkwa Mosis. Ya bụ, na-emenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa ụnụ.
Kama ụnụ emekwala omume ka ha, n’ihina ha na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya n’omume. Ha na-eke ibu siri ike obubu bo ndị mmadụ n’ubu, ma ha onwe ha agaghị emetụ ya ọ bụladị otu mkpịsịaka.
Ha na-arụ ọrụ ọma ha niile naanị ka ndị mmadụ wee hụ ha. Ha na-eme ka akwa e dere iwu ndị dị mkpa nke ha na-amado n’ihu na n’aka dị obosara na-emekwa ka ọnụ uwe ha buo ibu.
Ọ na-amasị ha ịnọ n’oche dị elu n’oriri, ịnọ n’ihu oche n’ụlọ nzukọ, ị nara ekele n’ọma ahịa nakwa ka ndị mmadụ na-akpọ ha ndị nkuzi.
Ụnụ ekwela ka a na-akpọ ụnụ ndị nkuzi, n’ihina ụnụ nwere naanị otu onye nkuzi. Ụnụ niile bụkwa ụmụnne. Ụnụ akpọla onye ọbụla nna ụnụ n’elu ụwa a, n’ihina ụnụ nwere otu nna nke bi n’eluigwe.
Ụnụ ekwekwala ka a na-akpọ ụnụ nnaukwu n’ihina ụnụ nwere naanị otu nnaukwu ya bụ Kristi. Ya bụ onye ọbụla kachasị n’etiti ụnụ ga-abụ odibo ụnụ.
Onye ọbụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-ebuda ya ala, ma onye ọbụla nke wedara onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu