Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ez: 28:1-10
-
Abụọma na azịza ya
Deut 32:26-27, 27-28, 30, 35-36
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMat: 19:23-30
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Ez: 28:1-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel
Okwu nke Yahweh bịakwutere m sị, “Nwa nke mmadụ, gwa onye na achị obodo Taị, ‘Yahweh Chineke na-ekwu nke a: Maka ihi na ngala juru gị obi, i kwuru sị: Abụ m chi, anọ m ọdụ n’ocheeze nke chi ahụ dị n’etiti osimiri, na-agbanyeghị na ị bụ mmadụ ị bụghị chi, i chere na gị na Chineke ha; ị matala ihe ugbu a karịa Daniel o nweghị ihe zoro ezo n’ebe ị nọ.
Site n’amamihe gị na akọ gị ka i ji nwee nnukwu akụnụụba; i nwere ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo n’ime ụlọ akụ gị.
Site na nnukwu amamihe i nwere n’ịzụ ahịa, i meela ka akụnụụba gị bawanye, mmụọ gị na-akpazi nganga n’ihi ụba gị.’
Ya mere na Yahweh Chineke kwuru sị: ‘Maka ihi na i chere na ị maara ihe dịka Chineke, aga m ezitere gị ndị ọbịa, bụ obodo nke dịkarịsịrị n’egwu; ha ga-abagide gị, mebie mma nke amamihe gị, metọọ otito gị.
Ha ga-atụba gị n’ime olulu, ị ga-anwụ ọnwụ ike n’ime osimiri. Ị ka ga-ekwu sị, ‘Abụ m chi n’ihu ndị ga-egbu gị, n’agbanyeghị na ị bụ mmadụ nkịtị, ị bụghị chi, n’aka ndị ga-emerụ gị ahụ?
Ị ga-anwụ ọnwụ nke onye ebighị ugwu n’aka ndị ọbịa, maka na ekwuola m ya’ – ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Deut 32:26-27, 27-28, 30, 35-36
Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ.
1. A sịrị m, ka m kpochapụ ha kpam kpam,
Mee ka ncheta ha kwụsị n’etiti mmadụ;
Ka ndịiro ha ghara ịghọtahie ihe merenụ,
Ka ha ghara ịnya isi.
Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ.
2. Ka ha ghara ịnya isi sị, ‘ike anyị ka anyị ji merie,
Na ọ bụghị Yahweh tigburu ndị ya,
ebe mụ onwe m mere ya.”
Izrel bụ mba na-enweghị akọnuuche,
Ha enweghị nghọta ma otu.
Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ.
3. Olee ka otu onye ga-esi merie puku ndị agha,
Otu mmadụ abụọ ga-esi chụọ puku mmadụ iri ọsọ,
Ma ọ bụghị na Nkume ha rere ha,
Na Chineke ha nyefere ha n’aka ndịiro?
Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ.
4. Oge na-abịa ngwangwa mgbe ha ga-ada
Ụbọchị nhuju anya ha dịkwa nso.
Ọ ga-emekwara ndị ohu ya ebere,
Mgbe Ọ hụrụ na ha enweghịkwa onye inyeaka.
Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ.
MBEKU – 1 Jọn 2:5
Alleluia, Alleluia:
Jesu Kraịst ghọrọ ogbenye n'agbanyeghị na Ọ bụ ọgaranya, ka unu wee site n'ogbenye Ya ghọọ ndị ọgaranya.
Alleluia.
OZIỌMA –Mat: 19:23-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu wee gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ana m agwa ụnụ eziokwu, ọ ga-esiri ọgaranya ike ịba n’alaeze eluigwe.
Ọzọkwa agwa m ụnụ, ọ dịkarịrị ịnyịnya ibu Kamel mfe ịgafe n’anya alanga karịa ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.” Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ọ tụrụ ha n’anya.
Ha wee na-ajụ sị, “Onyezi ka a ga-azọpụta?” Jesu lere ha anya sị ha, “Nebe mmadụ nọ, nke a ekweghị omume, mana o nweghị ihe nyịrị Chineke omume.”
Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “lee, anyị ahapụla ihe niile sobe gị, gịnịkwanụ ka anyị ga-eketa?” Jesu asị ha, “N’ịgwa ụnụ eziokwu, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya n’ụwa ọhụrụ, ụnụ ndị na-eso m ga-anọkwasakwa n’ocheeze iri na abụọ na-ekpe agbụrụ iri na abụọ nke Izrel ikpe.
Onye ọbụla nke hapụrụ ụlọ, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwaanyị, nna na nne, ụmụ mọbụ ala, n’ihi aha m, ga-enweghachi ihe ndị a narị kwuru narị.
Ọ ga-eketakwa ndụ ebighịebi. Ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ abụrụ ndị bu ụzọ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu