Tuzde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ez: 2:8-3:4
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 119: 14, 24, 72, 103, 111, 131
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMat: 18:1-5, 10, 12-14
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Ez: 2:8-3:4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel
Yahweh sịrị m, “Ma gị, nwa nke mmadụ, nụrụ ihe m na-agwa gị: adịkwala ka ndị nnupụisi a, meghee ọnụ rie ihe nke m ga-enye gị.”
Mgbe m lere anya, ahụrụ m aka e setịpụtaara m, nke ji akwụkwọ a pịakọtara apịakọta n’ime ya. O wee saghee ya n’ihu m e dere ya ihe n’ihu na azụ. Ihe e dere n’ime ya bụ okwu na-eweta ịkwa akwa, iru ụjụ na ịsụ ude.
O wee sị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe nke e nyere gị, rie akwụkwọ nke a a pịakọtara apịakọta, ma gaa gwa ụlọ Izrel okwu.” Ya mere, m meghee ọnụ m, O nye m akwụkwọ ahụ ka m rie.
Ọ sị m, “Nwa nke mmadụ, rie akwụkwọ nke a m na-enye gị ka I rijuo afọ gị.” Mgbe m riri ya, ọ dị m ụtọ dịka mmanụ añụ. Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gaa n’ụlọ Izrel gwa ha okwu nke m.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119: 14, 24, 72, 103, 111, 131
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
1. Ana m enwe añụrị n’iso iwu gị
Kama akụnụụba niile nke ụwa a.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
2. Iwu gị na-atọ m ụtọ
na-adụkwa m ọdụ.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
3. Iwu siri n’ọnụ gị pụta ka mma,
Karịa puku kwuru puku ọlaọcha na ọlaedo.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
4. Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ,
ọ dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
5. Iwu gị na-ewetara obi m añụrị,
ha bụ ihe nke m ketara ruo mgbe ebighịebi.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
6. Eghebere m ọnụ na-eku ume
n’ihi agụụ nke iwu gị.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
MBEKU – Matiụ 11:25
Alleluia, Alleluia:
Nara n’olu unu yoke m ma mụta ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, nweekwa obi umeala.
Alleluia.
OZIỌMA –Mat: 18:1-5, 10, 12-14
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Olee onye kachasị ibe ya ukwuu n’alaeze eluigwe?”
O wee kpọrọ otu nwatakịrị kwụba ya ọtọ n’etiti ha sị, “N’ezie agwa m ụnụ, ọ bụrụ na ụnụ agbanweghị dịka ụmụntakịrị, ụnụ agaghị aba n’alaeze eluigwe.
Onye ọbụla nke wedara onwe ya ala dịka nwatakịrị a, ọ bụ ya kachasị ukwu n’alaeze eluigwe. “Onye ọbụla nke ga-anabata nwatakịrị dị otu a nke ọma n’aha m anabatala m.
Lezienụ anya ka ụnụ ghara ileli otu n’ime ụmụaka ndị a. N’ihina ana m agwa ụnụ na ndị mmụọọma ha nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe oge niile.
N’ihina Nwa nke mmadụ bịara ịzọpụta ndị furu efu. Gịnị ka ụnụ chere? Ọ bụrụ na otu onye nwere otu narị atụrụ, ma otu n’ime ha agahie ụzọ, ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ndịọzọ n’elu ugwu gaa ịchọ nke ahụ gahiere ụzọ?
Ọ bụrụ na o nwere ka o si chọta ya, n’ezie agwa m ụnụ, ọ ga-añụrị ọñụ n’ihi ya karịa otu ọ ga-esi ñụrịa n’ihi iri itoolu na itoolu ndịọzọ ahụ na-agahịeghị ụzọ.
Ya mere, ọ bụghị uche Nna m nke bi n’eluigwe ka otu n’ime ụmụaka ndị a laa n’iyi.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu