Emume Ncheta Lawrence dị Asọ – Dikin na Onye egburu maka Okwukwe.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2Cor: 9:6-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 112: 1-2, 5-6, 7-8, 9.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJon: 12:24-26.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –2Cor: 9:6-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwuụkwọozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Ụnụ enyela na nwute na n’inwe obi abụọ, mọbụ dịka a manyere ụnụ amanye, n’ihina Chineke na-ahụ onye ji obi ụtọ enye onyinye n’anya. Chineke n’onwe ya, pụrụ ibutere ụnụ ngọzi n’uju, karịa ka ụnụ tụrụ anya.
Ọ pụrụ ime ka ụnụ nwezuo ihe niile na-akpa ụnụ nwekwaa nke fọdụrụ maka ezi ọrụ niile. Otu a ka e dere n’Akwụkwọ Nsọ sị, “O kesara akụ ya, o nyere ụmụ ogbenye ihe, obiọma ya na adịgide ruo mgbe ebighịebi.”
Chineke, onye na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ ọkụkụ na ihe oriri ga-enyekwa ụnụ mkpụrụ mọbụ ihe ụnụ ji arụ ọrụ obiọma. Ọ ga-eme ka ha mụbaa bụ ihe ọma nke ụnụ na-akụ dịka mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka ngọzi nke sitere n’ezi ọrụ ụnụ bawanye.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 112: 1-2, 5-6, 7-8, 9.
Azịza: Añụrị ga-adịrị onye na-eme ebere, na enyere ndị nọ na mkpa aka.
1. Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu,
onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!
Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,
agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi.
Azịza: Añụrị ga-adịrị onye na-eme ebere, na enyere ndị nọ na mkpa aka.
2. Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego,
ọ bụ onye eziokwu n’ihe niile ọ na-eme.
Ebe eziomume chedoro ya, ọ na-enwe ịkwụdosike,
ọ na-ahapụ ncheta ga-adị ebeebe n’azụ ya.
Azịza: Añụrị ga-adịrị onye na-eme ebere, na enyere ndị nọ na mkpa aka.
3. Ebe obi ya na nchekwube ya dị n’Onyenweanyị,
ọ gaghị atụ egwu ịnata ozi ọjọọ.
O ji ntachi obi emeri egwu ya,
n’ikpeazụ Ọ na-emeri ndị iro ya.
Azịza: Añụrị ga-adịrị onye na-eme ebere, na enyere ndị nọ na mkpa aka.
4. Ọ naghị atụfu oge inyere ndị ogbenye aka,
eziomume ya anaghị agbanwe agbanwe,
ndị dị otu a na-enweta nsọpụrụ mgbe niile.
Azịza: Añụrị ga-adịrị onye na-eme ebere, na enyere ndị nọ na mkpa aka.
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Jesu gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ihe nke ndụ.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Jon: 12:24-26.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Jesu gwara ụmụ azụ ya sị, “N’ịgwa ụnụ eziokwu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka adaghị n’ala, nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amịta ọtụtụ mkpụrụ.
Onye ọbụla hụrụ ndụ ya na-anya ga-atụfu ya, onye ọbụlakwa nke kpọrọ ndụ ya asị n’ụwa nke a, ga-edobe ya ruo ndụ ebighịebi. Ọ bụrụ na onye ọbụla na-agbara m odibo, ọ ga-esorịrị m.
Ebe m nọkwa ka nwaodibo m ga-anọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla na-agbara m odibo, Nna m ga-asọpụrụ ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu