Emume Nnwogha nke Onyenweanyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Dan: 7:9-10, 13-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps 97: 1-2, 5-6, 9.
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
2 Pet: 1:16-19
- OziọmaMat: 17:1-9
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Dan: 7:9-10, 13-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye amụma Daniel
Ka m na-ele anya ahụrụ m ka e doziri ocheeze, onye ahụ dịnụ site na mbụ weere oche ya, uwe ya na-acha ka akụmmiriigwe, ntụtụisi ya na-achakwa ka owu ọcha.
Ocheeze ya bụ ire ọkụ, ụkwụ ya bụkwa ọkụ na-enwu enwu. Nnukwu ire ọkụ si n’ebe Ọ nọ wee na-apụta, puku kwuru puku ndị mmụọozi nọ ya gburugburu imere ya ihe ọbụla Ọ chọrọ.
Otu a kwa ka nde kwuru nde mmadụ siri kwụrụ ya n’ihu, na-eche ka o kpee ha ikpe. Ọ dịghị anya e bido ikpe ikpe wee meghee akwụkwọ ikpe. Ahụkwara m na nrọ ahụ onye dịka nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’urukpu ojii.
Ọ bịara n’ebe onye ahụ dị na mbụ nọ, e duga ya n’ihu ya. E nyere ya ike ọchịchị na otito na ala eze, ka mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile wee gbaara ya odibo. Ọchịchị ya enweghị njedebe, ọ gaghị agafe agafe nke a ga-emebi ya emebi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 97: 1-2, 5-6, 9.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze! onye kachasị elu n’ụwa niile.
1. Onyenweanyị bụ eze! ka ụwa ñụrịba;
Ñụrịbanụ, ala niile mmiri gbara gburugburu.
Urukpu na ọchịchịrị gbara ya okirikiri;
o jiri eziomume na ikpe nkwụmọtọ were tọọ ntọala ocheeze ya.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze! onye kachasị elu n’ụwa niile.
2. Ugwu niile gbazere dịka mmanụ
n’ihu Onyenweanyị nke uwa niile.
Eluigwe na-ekwupụta eziomume ya,
mba niile na-ahụkwa otito ya.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze! onye kachasị elu n’ụwa niile.
3. N’ihina ị bụ Onyenweanyị,
onye kachasị elu n’ụwa niile,
onye kachasị chi ndịọzọ elu.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze! onye kachasị elu n’ụwa niile.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ : 2 Pet: 1:16-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pita dere
Mgbe anyị mere ka ụnụ mata ike na ọbịbịa nke Onyenweanyị Jesu Kristi, ọ bụghị akụkọ ifo ka anyị kọọrọ ụnụ. Kama anyị jiri anya anyị hụ ịdị ukwu ya.
Anyị nọ ebe ahụ mgbe Chineke Nna kwanyeere ya ugwu, nyekwa ya otito, mgbe otu olu dakwara n’ebube, sị, “Nke a bụ Nwa m hụrụ n’anya, onye ihe ya na amasị m!”
Anyị nụrụ olu ahụ si n’eluigwe n’ihina anyị na ya nọ n’elu ugwu ahụ. O doola anyị anya na ihe ahụ ndị amụma kwuru bụ eziokwu. Gbakwaanụ mbọ na-ege ntị n’okwu ahụ dị ka ọkụ nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọ n’obi ụnụ, anyanwụ ụtụtụ achawapụta na ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Nke a bụ Nwa m hụrụ n’anya, onye ihe ya na-amasị m, geenụ ya ntị.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Mat: 17:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Ka ụbọchị isii gachara Jesu kpọọrọ Pita, Jemis na Jọn nwanne ya rịgoro n’otu ugwu dị oke elu. Jesu gbanworo onwe ya n’ihu ha. Ihu ya mụkekwara dịka anyanwụ, uwe ya na-enwukwa dịka ihe.
Ozigbo ahụ ha hụrụ Mosis na Elaija ka ha na Jesu na-ekwurịta ụka. Pita gwara Jesu sị, “Dinwenụ, ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a; Ọ bụrụ na Ị chọọ aga m ewu ụlọ ikwu atọ n’ebe a: otu maka gị, otu maka Mosis, nke ọzọ maka Elaija.”
Mgbe Pita ka kpụ okwu n’ọnụ, urukpu ọcha kpuchidoro ha, otu olu si na urukpu ahụ daa sị, “Nke a bụ Nwa m m hụrụ n’anya, onye ihe ya na-amasị m, geenụ ya ntị.”
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ olu ahụ, ha tụrụ oke egwu, daa n’ala kpuchie ihu ha. Jesu bịara metụ ha aka sị, “Bilienụ, ụnụ atụla egwu.” Mgbe ha lelitere anya elu, ha ahụghị onye ọzọ beeresọ Jesu.
Ka ha si n’elu ugwu ahụ na-arịdata, Jesu dọsiri ha aka na ntị ike sị, “Ụnụ agwakwala onye ọbụla ihe ụnụ hụrụ ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-esi n’ọnwụ bilie.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu