Wenezde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jer: 15:10, 16-21
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 59:1-2,3-4,9-10,16,17
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatiu: 13:44-46
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Jer: 15:10, 16-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah
Aziị agbala m nne m, n’ihina ị mụrụ m ka m bụrụ ihe esemokwu na ihe ịrụụka n’etiti mmadụ niile. Ebinyeghị m mmadụ ego nke m na-ebiri ebiri ma ha niile na-ata m ụta.
Mgbe okwu gị bịara, e jiri m obi ịnụ ọkụ nabata ya, okwu gị bụ mmasị m na añụrị nke obi m, maka na a kpọrọ m n’aha gị, O Yahweh na Chineke.
Anaghị m anọ n’oriri na ọñụñụ ndị ajọ mmadụ, ana m anọ naanị m maka na aka gị ji m, ejupụtakwara m n’iwe. Gịnị mere na ihe ụfụ m ekweghị nkwụsị, ọnya m enweghịkwa ọgwụgwọ, o kweghịkwa ala?
Ị chọrọ ịghọgbu m dịka iyi nke na-ata n’oge ọkọchị. Yahweh kwuru sị: ‘Ọ bụrụ na ị lọghachi, aga m anabata gị, ị ga-akwụkwa m n’ihu.
Ọ bụrụ na i kwuo ihe dị mma na-abụghị nke abaghị uru, ị ga-adịkwa ka ọnụ m. Ha ga-abịakwute gị, ma ị gaghị agakwu ha.
Aga m eme ka i sie ike dịka mgbidi ọlaọkụ n’ebe ndị a nọ, ha ga-alụso gị ọgụ, ma ha agaghị emeri gị, n’ihina anọnyeere m gị iji zọpụta gị; ọ bụ Yahweh na-ekwu. Aga m azọpụta gị n’aka ndị ajọ mmadụ na n’aka ndị ogbu ọchụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 59:1-2,3-4,9-10,16,17
Azịza: Chineke bụ ebe nchedo m oge m nọ na nsogbu.
1. Zọpụta m n’aka ndịiro m Chineke m,
Chekwaba m n’aka ndị na-ebuso m agha,
Zọpụta m n’aka ajọ mmadụ ndị a
n’aka ndị ogbu mmadụ ndị a!
Azịza: Chineke bụ ebe nchedo m oge m nọ na nsogbu.
2. Lee ha na-ezo onwe ha ezo ka ha nwee ike ijide m,
Ha dị ike jikọtakwa onwe ha ọnụ imegide m
e nweghị mmehie njọ mọbụ ihe m mere ha,
Onyenweanyị, lee ka ha ji ọsọ na-ewere ọnọdụ imegide m.
Azịza: Chineke bụ ebe nchedo m oge m nọ na nsogbu.
3. Ike m, elekwasịrị m gị anya;
Chineke n’onwe ya bụ ebe ozuzu ike m
Chineke onye hụrụ m n’anya na-abịa,
Chineke ga-egosi m mmeri e meriri ndịiro m.
Azịza: Chineke bụ ebe nchedo m oge m nọ na nsogbu.
4. N’akụkụ nke m, ana m añụrị maka ike gị
ana m ekwe ukwe n’ụtụtụ niile
Ị bụ ụlọ nke siri ike oge niile
Ebe nchedo m oge m nọ na nsogbu.
Azịza: Chineke bụ ebe nchedo m oge m nọ na nsogbu.
5. Ike m ana m akụrụ gị egwu,
ụlọ m siri ike bụ Chineke n’onwe ya
Chineke onye hụrụ m n’anya.
Azịza: Chineke bụ ebe nchedo m oge m nọ na nsogbu.
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Abụ m ìhè nke ụwa, ka Onye-nwe-anyị kwuru; onye ọ bụla na-eso m ga-enwe ìhè nke ndụ.
Alleluia.
OZIỌMA –Matiu: 13:44-46
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara oke igwe mmadụ sị,”Alaeze eluigwe dịka akụ e zoro n’ubi nke otu nwoke hụrụ wee kpuchie ya ihe, o were ọñụ laa, ree ihe niile o nwere, bịa zụrụ ala ubi ahụ”.
“Ọzọ, alaeze eluigwe dịka onye na-azụ ahịa nke na-achọ ụlarị ọma. Mgbe ọ hụrụ otu ụlarị dị oke ọnụ, ọ lara, ree ihe niile o nwere, wee zụta ụlarị ọma ahụ”.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu