Tọọzde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Isaiah: 26:7-9, 12, 16-19
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 102:12-14, 15-17-18-20
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatiu: 11:28-30
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Isaiah: 26:7-9, 12, 16-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Isaiah
Ụzọ nke onye eziomume kwụ ọtọ; ịna-eme ka ụzọ nke ọ na-aga na ya dị larịị. N’usoro ikpe gị anyị chekwubere na gị O Osebụrụwa; ncheta nke aha gị bụ ihe mmụọ anyị na-achọ.
Mkpụrụobi m na-achọ gị n’abalị, mmụọ m na-achọsi gị ike. N’ihina mgbe ikpe gị pụtara ihe n’elu ụwa, ndị bi n’ụwa ga-amụta eziomume.
O Osebụrụwa! ị ga-enye anyị udo n’ihina ị na-akwụ onye ọbụla ụgwọ ka ọrụ ya siri dị. O Chineke! ha kpọkuru gị mgbe ha nọ na nsogbu; ha kpọkuru gị n’ekpere mgbe ị na-ata ha ahụhụ, I meela ka anyị tie mkpu akwa dị ka nwaanyị ime na-eme.
Anyị dị ime, ime mere anyị, ma ihe anyị mụpụtara bụ so ikuku. O nweghị ọrụ mgbapụta ọbụla anyị rụrụ n’ụwa, o nweghị ndị ga-ebi n’ụwa a mụrụ.
Ndị nke gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, ahụ ha ga ekulite. Ụnụ ndị nọ n’ili bilienụ kwebenụ ukwe añụrị! Dịka igirigi si ayọsa n’ala, otu ahụ ka Osebụrụwa ga-esi nyeghachi ndị nwụrụ anwụ ndụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 102:12-14, 15-17-18-20
Azịza: Onyenweanyị sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya.
1. Mana gị Onyenweanyị na-achị ebeebe;
ndụdụgandụ niile na-echeta gị
Kulie ka i meere Zayọn ebere,
n’ihina oge ebere erugo izi ya amara gị.
Ụmụodibo gị hụrụ ya n’anya,
n’agbanyeghị na e tikpọọla ya.
Azịza: Onyenweanyị sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya.
2. Mba niile ga-atụ aha nke Onyenweanyị egwu,
ndịeze ụwa niile ga-asọpụrụ otito gị;
N’ihina Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn;
Mekwaa ka ahụ ebube ya.
Ọ ga-aza ekpere ndị ogbenye,
ọ gaghị ajụ arịrịọ ha.
Azịza: Onyenweanyị sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya.
3. Ka e debaa ihe ndị a n’akwụkwọ maka agbụrụ ndị ga-abịa n’ihu,
ka ndị niile amụbeghị amụ were nwee ike too Onyenweanyị
Onyenweanyị sitere n’ebe nke ya dị asọ were ledata anya,
O sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya
Ka o were nụrụ ude ndị nọ na mkpọrọ na-asụ,
ka o were tọhapụ ndị a mara ikpe ọnwụ.
Azịza: Onyenweanyị sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya.
MBEKU – Jọn 14:5
Alleluia, Alleluia:
Bịakwutenụ M, unu niile na-agbasi mbọ ike ma nwee ibu arọ, M ga-enyekwa unu izu ike, ka Onye-nwe-anyị kwuru.
Alleluia.
OZIỌMA –Matiu: 11:28-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu kwuru sị, “Bịakwutenụ m, ụnụ niile ndị na-adọgbu onwe ụnụ n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, aga m enye ụnụ ezumike.
Nyaranụ ịnyagba nke m n’olu ụnụ; mụtakwanụ ihe n’omume m, n’ihina adị m nwaayọ dịkwa obi umeala. Ụnụ mee otu a, obi ụnụ ga-enweta ezumike. N’ihina ịnyagba m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu