Wenezde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Isaiah: 10:5-7, 13-16
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 94:5-6, 7-8, 9-10, 14-15
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatiu: 11:25-27
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Isaiah: 10:5-7, 13-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Isaiah
Azị gbakwa gị, Asiria, mkpọ igwe nke iwe m, mkpara nke obi ọkụ m. Ana m eziga ya imegide mba na-amaghị Chineke; Ezipụrụ m ya maka ndị ka kpasuru m iwe; ka o mebie ha, kwakọrọ akụ ha; zọpịa ha ka apịtị dị n’okporo ụzọ.
Mana o cheghị otu a, uche ya adịkwaghị na nke a; kama o bu n’obi imebi na ịkwatu ọtụtụ mba; Maka na O kwuru sị; Ọ bụ n’ike aka m ka m si wee mee ihe ndị a; ọ bụkwa site n’amamihe m, n’ihina enwere m nghọta;
Ewepụla m oke jikọrọ mba na mba, kwakọrọkwa akụ ha niile; Dịka oke ehi, a kwatuola ndị nọ n’ocheeze. Aka m anwụchiela akụnụụba ndị mmadụ dịka akwụ ụmụnnụnụ;
Dịka ndị mmadụ si achịkọrọ akwa a hapụrụ ahapụ; otu ahụ ka m si chịkọta ụwa niile; O nweghị onye megharịrị nku ya mọbụ saghee ọnụ ya, mọbụ mee mkpọtụ.
Anyiike, ọ ga-anara otito karịa onye ji ya awa nkụ? Mọbụ, nkwọ osisi ọ ga-asị na ya ka onye ji ya akwọ osisi ike?
Ọ ga-adị ka a ga-asị na mkpọ igwe na-efegharị onye ji ya; mọbụ na mkpara na eweli ihe na-abụghị osisi elu! N’ihi ya Yahweh nke igwe ndịagha, ga-ezigara ndị ya bụ dike n’agha ọrịa ga-ala ha n’iyi, Akụnụụba ya ga agba ọkụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 94:5-6, 7-8, 9-10, 14-15
Azịza: Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya
1. Onyenweanyị ha na-azọpịa ndị nke gị,
na-emegbu ndị bụ ekpe gị.
Ha na-egbu ụmụ nwaanyị ajadụ na ndị ọbịa;
Na-egbukwa ụmụ ndị na-enweghị nne na nna.
Azịza: Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya
2. Ha na-asị: Onyenweanyị anaghị ele anya,
Chineke nke Izrel amaghị ihe anyị na-eme.
Ụnụ ndị kacha nzuzu ndị na-amaghị ihe,
chịgharịanụ ihe ndị a n’obi ụnụ ka ụnụ mụta ihe.
Azịza: Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya
3. Ọ bụ na onye mere ntị a gaghị enwe ike ịnụ ihe?
Onye kere anya, O nweghị ike ịhụ ụzọ?
Ọ dị ụnụ ka onye na-agbaziri mba niile, agaghị ata ha ahụhụ?
Onyenweanyị, onyenkuzi mmadụ niile ọ gaghị enwe amamihe?
Azịza: Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya
4. N’ihina Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya,
Ọ gaghị echezọ ndị nke o jiri aka ya were họrọ
Ma ikpe nkwụmọtọ ga-abịaghachi n’ụlọ ikpe,
ndị eziomume ga-agbasokwa ya.
Azịza: Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya
MBEKU – Matiu 11:25
Alleluia, Alleluia:
A gọziri gị, Nna, Onye-nwe elu igwe na ụwa, i kpugheere ụmụaka ihe omimi nile nke Alaeze ahụ.
Alleluia.
OZIỌMA –Matiu: 11:25-27
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ Jesu kwuru sị, “Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe ndị a i zonahụrụ ndị amamihe na ndị okemmụta.
Ee, Nna, otu a ka o siri masị gị. Nna m ahanyela m ihe niile n’aka, o nweghị onye ọbụla maara Nwa ahụ ma e wezuga Nna.
Ọ dịghịkwa onye ọbụla maara Nna ma e wezuga Nwa, ya na onye ọbụla Nwa ahụ chọrọ ka ọ mara ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu