EKPERE MAKA NDỊ ỌRỊA
Oseburụwa mere anyị ebere
Kristi meere anyị ebere
Oseburụwa meere anyị ebere
Nna anyị nọ n'eluigwe
Ekwela ka anyị kwenye na nranye,ma nzọpụta odibo Gị
O Chukwu m, onye Chekwubere na gị, zitere ya inye aka, Oseburụwa inye aka nke si n'ebe dị nsọ
Ka Isi n'Eluigwe zọba ya.Ekwela ka onye iro merie ya ma ọbụ ka nwa nke njọ kpudebe ya nsọ merụọ ya ahụ Bum ufo nche ike nkeya.
O'Oseburụwa
N'ihi nke Onye iro.
Ka Oseburụwa wetara gị ike
N'elu aka mgbugi
O'Oseburụwa naraaririom
Ka mkpu akwa m ruo Gị ntị
KA ANYỊ RỊỌ ARỊRỊỌ
O Chukwu,Ngị Onye nwe ime ebere mgbe niile,na azọ ndụ ndị ji njọ anyị kudo onwe anyị ị ga were site n'ebere nke afọọma gị nweta mgbaghara.
O Chukwu sọ Ngị bu otu onye ịnye aka n'ọra nke ga-abụ gosi odibo gị na-arịa ọrịa ike enyemaka gị, ka ọga abụ ọ sọ n'afọọma Gị nweta ịnyeaka Gị, ọ dighichaa
ọbụrụkwa onye otu Nzụkọ gị n'ụwa nke a.
O Chukwu, Onyenweanyị anyị na-arịọ gị, mee ka odibo gị nụnwa gbasie ike n'ahụ na mkpụrụobi. Anyị arịọ gị, Oseburụwa Chukwu ka i mee ka odibo gị nụnwa dịrị n'ọrịa ya site n'arịrịọ nke Vejin Marịa dị ngọzị.
Site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen
ỊHE ỌGỤGỤ
KA ANYỊ RỊỌ ARỊRỊỌ
O Chukwu, Onye ji ike niile, dị ụwatụwa, ịnyeka ebighi ebi nke ndị kwerenụ, nụrụ olu anyị maka odibo gị (aha ya) onye anyị na-arịọ gị ka ị mee ebere nyere ya aka, ka ọ ga-abụ ọ dịghị n'ọrịa a ka ọ na-enye gị ekele na Nzụkọ gị; site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen
RỊỌ MAKA NDỊ ỌZỌ
Ndị nọ n 'ahụhụ na mkpa, kasie ha obi, ekwela ka ndị nọ n'ime ọnwụnwa daa. Dọkwara.ndị ha na ibe ha ma adịghị mma; nyere mmadụ niile aka n'ihena-akpa ha,mee ka ndị niile na-anwụ ugbu a nwụọ ọnwụ dị mma.Gozie ndị niile anyị na ha dị mma na ndị na-emenyere anyị ịhe ọma,na ndị niile anyị nwere iriọrọ aririọ n'ụzọ pụrụ iche.Meere ndị iro anyị niile ebere, mee ka ndi niile kwerenụ gara-aga zuru ike na ndokwa, ka I dụbata anyị niile na ndu ebighl ebi site na Kristi Dinwenụ anyị, Amen