ARỊRỊỌ IJI MỤTA AKWỤKWỌ
O Dinwenu anyị Jesu Kristi, Ngị onye kwurunụ sị;“Mụ bụ ihe nke na-egosi onye ọbụla pụtara ụwa ụzọ. Biko, mee ka m do ihu n'akwụkwọ otu m ga-esi mụta ya nke ọma. Ihe a ga-amụ sie ike kuziere m ka m mụta ya; nye m ike nke nghọta, ekwela ka ihe na-agbafụnahị m,ma Gị.ekwela ka mmụta nke ụwa nụnyem:isi nikpa nganga,ma kama mee ka m si n'umeala hụ n'ọbụ Ngị bụ Chukwu nyere m aka na mmụta. O Marịa, odo amamihe, rịọtara m Nwa gị bụ Chukwu ihe m na arịọ ya ugbu a, ya na ka mmụta nke ụwa ghara ime ka m chezọọ ịhe ndị dị ebighi ebi Obi di aso Jesu. Ngị ka m chekwubere,Marịa Nne nke Chukwu na odo amamịhe, rịọbara m Chukwu arịrịọ.Amen.