OMUME NKE IDO NSỌ NYERE OBI NSỌ JESU
O Jesu tọnarịcharaụtọ, onye mgbapụta ọha niile, lekwasị anyị anya ndị ji obi umeala sekpuru n'ihu alter gị. Nke gị ka anyị bụ, Mee ka anyị na gị dị mma nke ọma, lee anya ebe onye anọna taa ka o were uche aka ya chedo onwe ya nso, nyere Obi gị kacha nsọ.Ha hiri nne bu ndi na-amaghi Gi.Ha hiri nne bụ ndị na-eleli gị na-ajụ gị ajụ. Meere ha niile ebere, Jesu kacha ebere dooro ha niile nye Obi nsọ gị.
Bụrụ Eze, Oseburụwa, ọ bụghị so Eze ndị kwerenụ na-ajụbeghi gị, ka ị bụrụazị Eze Oseaka ndị gbalahara gị, ka ị kwe ka ọ ghara ite aka ka ha lọta n'ụlọ be Nna ha maka ha anwụfue n'ahụhụ na mkpa.
Bụrụ Eze ndị nkuzi hiere ụzọ site na nkewa. Kpọghachie ha azụ ka ha bịa genye ugbo n'otu nke eziokwu na ịdị n'otu nke okwukwe ka ọ ghara ite aka ka ọ bụrụ naanị otu ụlọ igwe atụrụ na onye nche atụrụ dị. Bụrụazị Eze ndị niile danyere n'etiti omume ndị gboo nke ndị ya na-akwụghị ọtọ, ajụkwala ịkpọpụta ha n'ọchịchịrị ka ha bata n'ime ihe nke alaeze nke Chukwu.
O Chukwu, chụsaara Nzụkọ gị ịhe egwu niile ka ọ nwere onwe ya, nye mba niile ndokwa na udo. Ka ị mee ka otu olu na-eti ka ụwa niile ha, na-asị; "Otito dịrị obi Chukwu anyị si wee nweta nzọpụta na Otito na nsọpụrụ dịrị ya ebighi ebi." Amen