OMUME NKE IDOZI OKWU A NA-ACHỌ OBI NSỌ JESU
OMUME NKE IDOZI OKWU A NA-ACHỌ OBI NSỌ JESU
(A na-eme ya ụbọchi Friday izizi n'ọnwa)
O, Obi Jesu kwesịrị ịhụnanya na nsekpuru Ngị nọ n'ime etiti obi niile, Ngị ịhụnanya na-acha ọkụ n'ime Gị. Ihe Nna gị na-acho tinyere na mgbapụta ọha n'ile dị Gị ọkụ sie ike. Obi nke ahụhụ anyị na-emetụta mgbe ọbụla, chedo mgbe ọ bụla ka ị gbooro anyị ajọ ịhe. Ngị ịhụnanya dụnyere n'iji onwe Gị chụ aja debe na Yụkarịstịa dị asọ, chụazị aja n'Altar nke obe nke medara Chukwu Obi maka njọ. Ebe ọbụ na ọtụtụ ndị otu Chukwu enweghị ịhe ọzọ ha
na-eme iji kwu gị ụgwọ maka ebere gị nile ndị a, karịa ịkpọ amara ị na emere ha ịhe, chefuo ịhe ha nwere ịme n'ebe ị nọ, inye gị ekele, onye kachasị emezi ịhe, ọ na bụrụ ịhe ziri ezi na anyịnwa bụ ndị nke gị, anyị bụ ndị maara nke ọma ihe ajọ mkparị nke bụ n'ebe ị nọ, ga-agba mbọ, ka ọ kwere anyị me, rịọ gị mgbaghara n'ụzọ dị mma, na etu kwesịrị nsọpụrụ dịrị nnukwu ebube gị kacha nsọ
Ya ka anyị jiri daruo ala were obi umeala na-ekwuputa ka o siri dị anyị n'obi ezie, na ka anyị nwere ike imenụ, ka elu na ala nụrụ na anyị akpọọ ihe a ha na-eme asị, jụ ya ajụ. Anyị maara na oke mgbu si na njọ kwuru njọ anyị na-eme wudoro gị n'obi dị nro karịrị okwu, anyị maara na ibu mmehie anyị nke nyịdara ihu gị n'ala n'ogige nke Olives ekweghị obubu, ka ị na-atụ ume ọnwụ n'ugwu Kalvarị were ịhụnanya uru obi na ụfụ ọnwụ na-achọ tupu i kubee, ka ikpọchighata ndị
njọ n'ime ihe dịrị ha, ya na ime ọpịpịa maka njọ ha, anyị maara na oke ahụhụ dị n'obi gị mgbe ahụ abụghị ịhe obi ga-anado.
Anyị maara ịhe nile a onye nzọpụta anyị were uche aka anyị si n'ahụhụ ndị a ma ọbụ soro taba nke gị
O Jesu kacha ebere Ngị na-anọ alter anyị mgbe nile, nọrọ saa obi gị ka ị nara ndị ọrụ nile na ndị nile nọrọ n'ahụhụ
Obi Jesu kwesịrị nsekpuru Ngị, bụ ezi ebere nke obi maka njọ si abịa, tinye n'ime obi anyị ezigbo mmiri ka anyị n'anya,ka anyị na-ebe akwa maka njọ anyị na nke ụwa. Gbaghara, O Jesu bụ Chukwu gbaghara mmejọ nile, ajọ okwu nile, enweghị nsọpụrụ nile, na mmerụ nile eji emegide gị na Sakramnentị nke Yukaristịa bido mgbe edoro ya. Biko nara nwantịntị ịhe a, anyị ji tinye aka n'aja mmee ahụ i hunyere Nna gị dị ebube n'elu obe. Ọ bụ nrogha anyị ji ezi obi nye gị ụgwọ ọrụ anyị na-erite kwa ụbọchị n'alter ebe ị nọ, buru aja dị ndụ ana achụ na-achụrịrị.
O Jesu bụ Chukwu, gozie izuzu na-anụ ọkụ n'obi anyị ugbua, na ihe ọma anyị bu n'uche ịmenụ bụ ịdị na-ahụ gị n'anya, na-esekpuru gi,site taa gaa n'ihu na Sakramentị nke ịhụnanya bụ Yụkaristịa,ka anyị were obi anyị chighaa ezie n'ebe ị nọ, obi na-anụ ọkụ maka ịhe na-enye gị Otito, were si etu a mezie agbanyeghị na enweghị okwukwe anyị ji mejọ n'oge ndị gara aga.
Buru O Obi Jesu kwesịrị nsekpuru; Ngị maara aja e ji kpụ anyị, bụrụ onye ọgbụgbọ anyị kpasuru iwe nke ukwu. Mee enweghị ike anyị ka ọbụrụ ike; mee izuzu anyị ka o sie ike; were ịhụnanya gị, umeala gị, obi ebere gị, na ndidi gị gbaghara anyị njọ anyị nile. Bụrụ inye aka anyị onye ogbugbo anyị na ike anyị nile ka ọ ghara inwe ihe ga eketọpụ anyị n'ahụ gị site taa gaa n'ihu ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ. Amen