ARỊRỊỌ MAKA NDỊ ỌZỌ
0 Jesu,lekwasị Nzụkọ Gị dị asọ,bụ Nne anyị anya,Gozie Ụkọchukwu nke na-akpachapụrụ mkpụrụobi m anya, lekwasị nna m na nne m na ụmụnna m na ndị niile na-emere m afọọma anya.Gozie ha níile ma n'ahụ ma na mkpụrụobi, meere ndị ome njọ ebere, zọpụta ha n'ọkụ mmụọ.
Ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga, site n'ebere nke Chukwu were zuru ike na ndọkwa.Amen.