MAKA MMADỤ
50. Onye bụ mmadụ?
Mmadụ bụ onye Chukwu kelu, nwel’ uche, nwe arụ na nkpụrụobi ekelụ o yie Chukwu
51. Onye bụ nwoke mbụ?
Adam bụ nwoke mbụ.
52. Onye bụ okporo mbụ?
Eve bụ okporo mbụ.
53. Kedu ka Chukwu si kee nwoke mbụ?
Chukwu ji aja kee nwoke mbụ, we fụkwasa ya ụfụrụ nkpụrụobi ya, tinye ya n’ ogige nk’aṅulị.
54. Kedu ka Chukwu si kee okporo mbụ?
Chukwu melụ Adam k’ọ rarụ ụra wee mịrị ofu mkpịsị ngụ ya were kee Eve, ọ wee nye ya nkpụrụobi dịka Adam.
55. Kedu n’ ọkwa Chukwu kelụ ‘’Adam na Eve’’?
Ọ kelụ fa kenye n’ ọkwa ịdị nsọ, n’ ime –mma, n’ anwụ- anwụ.
56. Adam na Eve fa akwudosirike n’ ọkwa fa afụ?
Mba, fa melụ njọ wee daa
57. Kedụ njọ Adam na Eve afụ?
Fa kachiri ntị n’ okwu Chukwu, were taa nkpụrụ osisi a si fa atana.
58. Kedu k’ esi pịa Adam na Eve maka njo fa?
- Anapụ rụfa nọkwa ịdị nsọ, we chụpụ fa na paradaịs
- Fa malụ njọ, aghụghọ, taba afụfụ, nwụb’ ọnwụ
- Enuigwe chinarị fa.
59. Njọ Adam na Eve ọpụtụgbadolụ k’ụmụ fa nine ra?
Eye, dịka njọ si arụ ofu onye bata n’ ụwa, ọnwụ azi sitelụ na njọ, nọfụ azị k’ ọnwụ si rute mmadụ nine ( siten’ arụ ofu nwoke) nke mmadụ nine nọ n’ arụ ya mee njọ.( Rom. V 12)
60. Ọ nwelụ onye ọbụna n’ eburọ njọ eker’ụwa?
Eye, ọ nwere ofu onye n’ eburọ njọ eker’ụwa, ya bụ Veejin Marịa, ya ka eji akpọ ya Veejin atụl’ ime ya n’ejighị njọ sitena Chi.
61. Chukwu ọ gbanarịrị anyị n’ ajọ ọkwa nna anyị mbụ debel’ anyị?
Mba, o meere’ anyị ebere we e nye anyị onye nzọpụta.
62. Onye bụ onye nzọpụta afụ?
Onye – nzọpụta afụ bụ Jesu