MAKA NDI MMỤỌ- ỌMA
40. Ole ndị bụga ndị mmụọ-ọma?
Fa bụ ezi mmụọ Chukwu kegalụ ka fa malụ ya, n’ afụya n’ anya, n’ efe ya, n’ ejelụ ya ozi.
41. Otu mmuụọ ole dị?
Fa dị ụzọ otu mmụọ nabọ: ndị bụ ezigbo na ndị bụ ajọ ya.
42. Kedu nịi bụ ezi mmụọ?
Fa bụ ndị kwụgidelụnụ, n’ feelịlị Chukwu.
43. Ked’ife ndị mmụọ- ọma nụ jetalụ site na nkwugide fa kwụgidelụ nwụọ?
Fa jetalụ ịdị n’ aṅụlị ebebe n’ enuigwe.
44. Ked’ ife ndị mmụọ- ma n’ emegal’ anyị?
Fa n’ ebu ayịyịọ anyị n’ ebugalụ Chukwu; imelime nime fa nwelụ iche anyị: ndị afụ k’’ ana akpọ mmụọ-ma ndị nche.
45. Onye bụ onye isi ndị mmụọ-ma?
Onye isi ndị mmụọ-ma bụ Maịkelu dị asọ.
46. Kedu ndị bụ ajọ mmụọ?
Fa bụ ndị mmụọ nụ ji ngala weme isi-ike n’ iru nke Chukwu, fa k’ an’ akpọ ekwensu.
47. Onye bụ ony isi ndị ajọ mmụọ?
Onye isi ndi ajọ mmụọ bụ Lusifa.
48. Kedu ka Chukwu si pịa ndị ajọ mmụọ nụnwa?
Ọ marụ fa ikpe ịba n’ ọkụ mmụọ ebebe.
49. Kedu ife ekwensu n’ emega n’ ebe anyị nọ?
Fa n’ eduba any ị na njọ k’ anyi wee soro fa jee n’ afụfụ fa, n’ ebe Satan nọ, bụ onye elibelu ekwensu, isi ya bụ, onye mmanye n’ onye nnega.