OKE MBỤ NK’ OKWUKWE
22. Kedụ nke bụ oke mbụ nk’ okwukwe?
Oke mbụ nk’ okwukwe bụ: Ekwem na Chukwu Nna, onye pụrụ ime ife nine, onye kere enuigwe n’ anị.
23. Onye bụ Chukwu?
Chukwu bụmmụọ ọkasị akasị, onye ji ak’ ya dịrị n’ onweya, n’ enwerọ mbido, na enwerọ njedebe, bụrụazịonye okike n’ osebụrụwa nk’ ife nine.
24. Maka gịnị k’ eji akpọ Chukwu onye pụrụ ime ife nine?
If eji akpọ Chukwu onye pụrụ ime ife nine bụn a ọnwerọ ife nyịrị omume na ebe Chukwu nọ.
25. Maka gịnị k’ eji akpọ Chukwu onye kere enuigwe n’anị?
If eji akpọ Chukwu ony kereenuigwe n’ anị bụ makan’ ọ kere enuigwe n’ ani n’ ife nine n’ ejighi ife kee site na ike okwuọnụ ya.
26. Chukwu ọnwere u isi- mbido kaa?
Chukwu enwero isi- mbido: ọ dịrịị adị, ọ dịfụụ, ọ gan’ adịrịrị.
27. Ebee ka Chukwu nọ?
Chukwu nọ ebe nine.
28. Chukwu ọmazụrụ ife nine, n’ afuzu ife nine ka?
Chukwu mazuru ife nine, n’ afuzu ife nile ọbụla godu ilulo anyị bụ n’ uche .
29. Chukwu ọnwedụrụ arụ kaa?
Chukwu enwerọ arụ mancha, ọ bụ mmụọ
30. Gịnị bụ mmụọ?
Mmụọ bụ ife dị adị dị ndụ, nenwerọ arụ, an’adafụ anya, mọbụ nụ onu ya, mọbụ metụ ya aka
31. Ụzọ mmụọ ole dị?
Faa dị ụzọ mmụọ nabọ: mmụọ an’ekerọ eke bụ Chukwu n’ ọnweya, na mmụọ ndị eker’ eke, bụ n dị enjelụ n’ ekwensu, na nkpụrụobi anyi ga.
32. Ọ bụ s’ ofu chukwu dị?
Ọ bụ s’ ofu Chukwu dị.
33. Fa dị “pesịn” ịtọ na Chukwu kaa?
Eye, fa dịpesịn ịtọ na Chukwu, Chukwu Nna, Chukwu Nwa, na Chukwu Mmụọ- nsọ.
34. Person ịtọ a bụdụ Chukwu ịtọ kaa?
Mba, person ịtọ a abụrọkwọ Chukwu ịtọ: Nna bụ Nwa na Mmụọ- nsọ bụ ofu Chukwu n’ ibe ya afụ.
35. Pesịn ịtọ a fa razu nranya na mma?
Eye, fa razulu nranya na mma, ka nke si dị k’ ibe ya si dị
36. Gịnị k’ an’ akpọ if’ omimi nke pesin ịtọ n’ ime ofu Chukwu?
Ife an’ akpo if’ omimi nke pesịn ịtọ nim’ ofu Chukwu bụ ịtọ nim’ ofu dị ngozi.
37. Ked’ isi ife bụ if’ omimi?
Ise ife bu ife omimị bụ ezi okwu abụna ezi okwu Chukwu ji ak’ ya wepụta ma ya akarịa uche mmadụ nghọta .
38. Ọ nwelu ka nkpụrụobi ị si yi ịtọ nim ofu dị ngozi kaa?
Ka nkpụrụobi m si yi ịtọ- nim- ofu dị ngozi bụ na ka fa si dị pesịn ịtọ n’ ofu Chukwu, n’ofu ka fa si dịazị ike ịtọ n’ ofu nkpụrụobi m.
39. Kedugadụ ike ịtọ afu dị na nkpụrụobi ị?
Ike ịtọ dị na nkpụrụobi m bụga: ncheta, nghọta, uche .