IWU NK’ ISI
299. Kedu nke’ bụ iwu nk’ isi?
Iwu nk’ isi bụ: ‘Ngị ayịn’ ọyị.
300. Ked’ ife iwu nk’ isi mabidolu?
Iwu nk’ isi mabidolu njọ nine lulu inyi n’ebe ikporo mọbụ nwoke
Nọ.
301. O nwelu if’ ọzọga iwu nk’ isi a mabidolu?
E ye, iwu nk’ isi mabidolu ife abụna ife n’ akwunyerọlụ ịdị ọcha dị
asọ site na ine anya, n’ okwuga, n’ omumega.
302. Ajọ egwu dịazi n’ife iwu nk’ isi mabidolu ka?
E ye, ọmabidoazịlị ajọ egwu nine bụ iwu nk’ isi ebeọ dịazi njọ bụ
ikili Fa.
303. Iwu nk’ isi mabidoazịlị aj’ abụga, n’ ajọ akwụkwọga, n’ ajọ
Onyinyo ka?
E ye, iwu nk’ isi mabidolu aj’ abụ, n’ ajọ akwụkwọ. n’ajọ onyinyo,
Makana fa ad’ adịlị nkpụlobi mma, fa n’ eduzi n’ ụzọ njọ’ ogbugbu.
304. Onye dugalu onye ọzọ k’ome aj’ ife, o meazịlị njọ ka?
E ye, o melu nnukwu njọ, makan’ o mebili nkpụlobi onye ọzọ na
Nke onwe ya.