IWU NK’ISE
292. Kedu nke bụ iwu nk’ ise?
Iwu nk’ ise bụ: Ngị egbun’ ọchụ’.
293. ked’ ife iwu nke ise a mabidolu
Iwu nk’ ise mabidolu imewuta mmadụ n’arụ ya na nkpụlobi ya.
294. Gịnị k’ eji emewuta mmadụ n’arụ?
An’emewuta mmadụ n’ arụ ya siten’ iti aka g’ emelu ya arụ, n’ igbu
ya arụ, n’ igbu ya, mọbụ ịnụkwanyelu ndị ọzọ ka fa mebe etuafụ.
295. Gịnị keji emewuta mmadụ na nkpụlobi ya?
Ife eji emewuta mmadụ na nkpụlobi ya bụ site na nkwatu na njọ, n’
ajọ ndụmọdụ na nkuzi asị.
296. Kedu kwazi if’ ọzọga iwu nk’ise a mabidolu?
If’ ọzọ iwu nk’ ise mabidolu bụ ịnụ ọgụ, ikọ ọnụ, aj’ okwu, iwe, ikpọ
asị, na amịbọ.
297. Anyị nwel’ ike igbu onw’ anyi ka?
Mba, makan’ ọ bụ sọ Chukwu nwe ndụ anyị.
298. Gịnị k’ onye lụlụ mmadụ arụ n, arụ ya na nkpụlobi ya geme?
Onye lụlụ mmadụ arụ n arụ ya na nkpụruobi ya g emezil’ ya fa etu
ọ g’ ekwe ya.