IWU NK’ỊNỌ
282. kedu nke bụ iwu nk’ịnọ? Iwu nk’ịnọ bụ: ‘Sọpụlụ nna ị na nne ị’’.
283. Ked’ ife amal’ anyị n’ iwu nk-ịnọ a?
Amal’anyị n’ iwu nk’ịnọ k’anyị fụ nna anyị na nne anyị n’anya, n’
Asọpụlụ fa, n’ekwe ife fa agwan’anyi n’abụrọ njọ.
284. Maka gịnị k’anyị g’eji n’asọpụlụ nna anyị na nne anyị?
Ife anyi g’eji n’asọpụlụ nna anyị na nne anyị bụ makana fa nọl’anyi
n’ ọkwa chukwu.
285. Ọ bụ sọ nna anyị na nne anyị k’amal anyị iwu ịdị n’anụ nke
Fa ka?
Mba , ọ bụrọkwa sọ nna anyị k’ amal’anyị iwu ịdị n’anụ ife fa
Kwulu, anyị g’an’anụ azị nke ndị isi Ụkọchukwu na ndị Uko-chukwu
Anyị kwuazịlị, na nke ndị isi n’achị-ani na ndị isi anyị kwuazịlị.
286. Ọ bụ ọlụ dịl’ anyị ka, bụ ịdị n’enyelu nne anyị na nna anyị
Aka n’ ife n’ akpa fa?
E ye, ọ bụ ọlụ dịl’anyị bụ inyelu nne anyị na nna anyị aka na nkpa
Fa, ka nke nkpụlobi ka n’ k’ arụ.
287. O bụazị ọlụ dịl’anyị bụ ịdị natụkọta ifefag’eji n’azụ ndị nkuzi
Anyị ka?
E ye, ọ bụazị ọlụ anyị : makana ‘paul’ dị asọ kwulu sị: Osebuluwa
dolu ka fa si n’ Ozi-Oma n’adị bụ ndị n’ekwuputa Ozi-oma’ (1
kor, ix, 14)
(ofu ụzọ anyị si alụ ọlụ a bụ site na ịkwụ A. M. C.)
288. Ked’ọlụ ndị bụ nna na nne n’ebe ụmụ fa nọ?
Ọlụ nna na nne n’ebe ụmụ fa nọ bụ igbolu fa ife n’akpa fa, ikuzili fa,
n’ agbazili fa, nyeazị fa ezi nkuzi nke catholic.
289. ked’ ọlụ ndị fa na mmadụ na abụrọ ụmụ fa bi na ndị bụ isi?
Ọlụ ndị mmadụ binyeagalụ na ndị bụ isi bụ ine ndị nọ n’okpulu fa ezi
anya, n’ enyelu fa aka ịdị n’ alụ ọlụ ụka fa.
290. Ked’ife iwu nk’ịnọ mabidolu?
Iwu nk’ịnọ mabidolu nneni, isi-ike, ekwe-ekwe n’ ebe nna anyị nọga.
291. Ụmụ g’ an’ anụkwọfụ ife nne na nna mọbụ ndị bụ isi kwulu
bụ ajọ ife?
Mba, makana ebe ọbụ njọ, anyị g’ ebulu isi nụsịgodu nke Chukwu bịa
nụba nke mmadụ.