OKWUKWE NDỊ APỌSTỤỤ
19. Ked’ ife bụ ife Chukwu gosigalụ?
Ife bụ ife Chukwu gosịgalụ dịga n’ okwukwe ndi apọstụụ.
20. Gụọ okwukwe ndi Apọstụụ?
Ekwe m na Chukwu, Nna pụrụ ime ife nine, onye kelu enuigwe n’ ani, ya na Jesu kristiofu nwa ya Eze anyị, onye atụl’ ime ya sit’ na ike nke mmụọ- nsọ, amụọ ya na Virgin Marịa, ọ taa afụfụ n’ oge nke Pọntuus Paịleetị. Akpodo ya, n’ obe, ọ nwụọ enie ya: o zida na mmụọ n’ ụbọsi nk’ tọ ọ sikwa na ndị nwụrụl’ anwụ pụta, ọ rọgolụn’ enuigwe, ọ nọdụ n’ aka nri Chukwu nna, ọnye pụrụ ime ife nine, n’ebe afụ K’ ọ g’ esi bịa g’ ekpe ndị dị ndụ nan dị nwụranwụ. Ekwem na Mmụọ- nsọ, na nzụkọ nsọ Katoliiki, na nmekọnke Ndị-nsọ, na mgbaghalụ nke njọ, na mbilite n’ ọnwụ nk’ arụ, na ndụ ebebe. Amen.
21. Kedu k’ esi wee kee okwukwe ndị Apọstụụ?
K’ esi wee kee okwukwe ndị Apọstụụdị ụzọ iri n’ ibụa.