IWU NK’ABỌ
269. Kedu nke bụ iwu nk’abọ?
Iwu nk’abọ bụ: ‘Ngi ewena afa Chukwu ngi na nkiti.
270. Ked’ife amal’anyi n’iwu nk’abọ a k’anyi mee?
Ife amal’anyi n’iwu nk’abọ a k’anyi mee bụ, k’anyi welu nsọpụlụ n’akpọ afa nke
Chukwu n’afa Ndi di asọ, n’ife di asọ, k’anyi ghalụ ịlụ ezi iyi anyi ṅulụ, n’ezi nkwa anyi
kwelu.
271. Gini bụ iṅu iyi?
Ịṅụ iyi bụ ịkpọ Chukwu k’ọ bụlụ onye ama n’ife anyi kwugalụ na nke anyi kwegalụ na
nkwa.
272 . Ọ di mma bụ iṅụ iyi?
Iyi n’adi mma bụ iyi aṅụpụtalụ nsọpụlụ nke Chukwu n’iyi aṅụlụ maka ọdi-mma
nk’onwe anyi mọbụ nke mmadụ ib’anyi.
273. Ụzọ iyi onee di njọ?
Fa di ụzọ ịtọ: iyi medidel’ezi okwu na nke medidel’ikpe kwu ọtọ, n’iyi nkịtị.
274. Ked’if’ọzọga iwu nk’abọ mabidokwazili?
If’ọzọga iwu nke abọ mabidokwazili bụ nkwutọ, ịbụ ọnụ, n’okwu lụlụ alụ.
275. Gịnị bụ nkwụtọ?
Nkwụtọ bụ ajọ okwu ekwugalụ Chukwu mọbụ Ndi di asọ, mọbụ kwugalụ ụka.
276. Gịnị bụ ibu ọnụ?
Ibu ọnụ bụ aj’izuzu anyi gosili n’okwu anyi n’arụ onw’anyi mọbụ n’arụ mmadụ ib’anyi.