MAKA ONYINYO DI ASỌ
263. Iwu nke mbu, ọ machiro ịkpụ mọbụ idebe onyinyo di asọ?
Mba, iwu nke mbụ amachirọkwa ịkpụ mọbụ idebe onyinyo dị asọ, ma ife ọ machili bụ
isekpulu fa dika Chukwu: Ngi esekpunalụ fa, nk’ị n’efe fa’.
264. Gịnị melu iwu nke mbu n’ejiro machi ịkpụ onyinyo?
Ọ bụ makana Chukwu n’onw’ya agwanugo mmadụ ka fa kpụa onyinyo Nke mbụ bụ
akwụkwọ nke Exodus’ (XXV 18) ebe ọ si: ‘Na ngi mebe ‘kerubim’ nabọ nke ọla edo’
nk’ịbụa bụ n’ akwụkwọ nke Numbers ebe Osebuluwa si Moses: Kpụa agwọ
nk’on’ọku……..‘Moses wee kpụa agwọ nk’on’ọku, k’onye ọbụna nelụ ya anya wee dị
ndụ.(Num.Xx1,8,9).
265. Ndi Catholic, fa n’esekpulu onyinyo di asọ fa.
Mba, makana fa echekwuberọ ya; nke fa n’ene ya anya n’o nwelu mma ọ g’eme, mọbu
n’o nwelu ike nke Chukwu.
266. Gini melu anyi ji asọpulụ onyinyo di asọ?
Anyi na asọpụlụ onyinyo di asọ makana fa nọl’anyi n’ọkwa onye tolu nsọpụlụ, dika Jesu
Kristi’mọbụ Virgin Maria, mọbụ Ndi di asọ.