MAKA NDI DI ASỌ
260. Amachiazili inye ndi Angel na Ndi di asọ nsekpulu dịlị Chukwu ka?
Eye amachili anyi inye ndi Angel na Ndi di asọ nsekpulu dịlị Chukwu.
a. O nwelu ebe ọ di n’akwụkwọ di asọ maka inye ndi Angel na ndi di asọ nsọpụlụ ka?
Eye, o nwelu ebe o di n’akwukwo di aso mak’inye ndi Angel na Ndi di aso nsopulu
dik’esi dee n’akwụkwọ nke “Joshua” (V 13-15) ebe ekwulu sị na “Joshua” dalụ kpudo
iru ya n’ani runatalụ ofu Angel afụ.
b. O nwelu ebe ọ di n’akwụkwọ di asọ maka iyọ ndi Angel na Ndi di asọ ayiyọ?
Eye dik’esi de n’akwụkwọ nke “Genesis” na “Jakob” yọlụ otu Angel afụ, nke
zọpụtagolu ya imelime ifega k’ọ gọzielu ya ụmụ ya ga (Gen,ILVIII:16): edekwazị
n’akwụkwọ nke “Revelation” na Ndi di asọ bụ ndi ogbugbo anyi: n’ebulu ayiyọ nke ndi
ezi omume n’ebugalụ Chukwu (Rev.V.8).
260. Amachiazili inye ndi Angel na Ndi dị asọ nsọpụlụ ka?
Mba, amachirokwol’anyi inye ndi Angel na Ndi di asọ nsọpụlụ nke lulu fa, nke fa ji
bụlụ ndi odibo n’ezi ọyi Chukwu.(1).
261. Anyi g’an’ayọkwọlị ndi Angel na Ndi di asọ ka fa n’ayọl’anyi ayiyọ?
Eye, anyi g’an’ayọkwọ ndi Angel na Ndi di asọ ka fa n’ayọl’ anyi ayiyọ makana fa bụ
ọyi anyi na ụmụ-nna anyi, na makan’ayiyọ fa n’adinari ile n’ebe Chukwu nọ.(2).
262. Kedu k’anyi g’esi gosi na ndi Angel na Ndi di asọ n’ama ife n’eme n’ụwa?
K’anyi g’esi gosi na Ndi Angel na ndi di asọ n’ama ife n’eme n’ụwa bụ site n’okwu nke
Kristi. ‘N’aṅuli g’adi n’iru ndi Angel nke Chukwu mak’ ofu onye ọjọ nke
loghalunu.(Luk, CV,10)