MAK’IWU NKE MBỤ
247. Kedu nke bụ iwu nke mbụ?
Iwu nke mbụ: ‘Abụ m Nna, Chukwu gi, ngi enwena Chukwu’ ọzọ belụsọ m’.
248. Ked’ife amal’anyi n’iwu nke mbụ k’anyi mee?
Ife amal’anyi n’iwu nke mbụ k’anyi mee bụ, k’anyi sekpuelu ofu Chukwu, nke bụ
ezi Chukwu, nke di ndụ site n’okwukwe, na nchekwube, n’ifunanya ya n’ọlu dịl’
anyi n’ụka.
249. Gịnị melu anyi g’eji n’esekpulu sọ Chukwu?
Anyi g’en’esekpulu sọ Chukwu makan’ya bụ sọ onye okike n’oseburuwa kee ife nine.
250. Ked’ekpo anyi g’eji n’esekpulu Chukwu?
Anyi g’enesekpulu Chukwu ekpo-mekpo, iradụ kwụtụtụ na kwa anyasị, ya na
mbọsi ụka na Mass di asọ.
251. Kedu k’anyi si emelu iwu nke mbụ?
Anyi nalụ iwu nke mbu site n’ime njọ medidel’okwukwe, nchekwube, ifunanya, ya
n’ọlụ dil’anyi n’ụka.
252. Kedu njọ medidegalụ okwukwe?
Njọ medidegal’ okwukwe bụ: ụka asị ịma ụma natụ uche, ekwe ekwe, mọbu ijụ
nkụzi ọbụna nk’okwukwe ya n’amata nkụzi nke Nzụkọ amalụ n’onye pụlụ imụtanụ.
253. Kedu k’anyi si atunye onw’anyi n’ụzọ okwukwe anyi g’eji funari anyi?
Anyi n’atunye onw’ anyi n’ụzọ okwukwe g’eji funari anyi site n’ineghalụ ọlụ dịlị anyi
n’ụka anyi anya, site n’igụ ajọ akwụkwọ n’ije akwụkwọ n’abụrọ akwụkwọ catholic,
n’ije ụka mọbụ n’isonye n’ayiyọ ụka asị.
254. kedu njọ medidegalụ nchekwube?
Njọ medidelu nchekwube bụ nkolopu, n’iji ngala na echekwube.
255. kedu njo medidegalu ifunanya?
Njọ medidegalụ ifunanya bụ njọ abụna njọ, iradu ikpọ Chukwu asị.
256. Ked’isi njọga medidel’ọlụ dịl’anyi n’ụka?
Isi njọ medidel’ọlụ dịl’anyi n’ụka bụ isekpụlụ Chukwu asị, mọbụ alụsi ya n’iwelụ
Nsọpụlụ dịlị sọsọ Chukwu wenye ife ọbụna ekel’eke.
257. Iwu nke mbụ machibidulu mmeko nke ekwensu afa, n’aja,n’ife ọbụna gbanyebelụ
fa ka?
Iwu nke mbụ machibidolu mmekọ ọbụna, ichekwube nlọ, n’ụmụ akafieli ife mmadụ
n’emega.
258. Ọbu nkafie, bụ isekpulu alụsi?
Eye, ọ bụ nkafie bụ isekpulu alụsi, makana mmadụ mebelụ fa, ndụ fa enwe, ike ikwu
okwu ma fa enwe, nke fa n’afụ ụzọ, nke fa n’anụ ife, ije fa eje, mmerube fa emerube,
ife ma fa eli, we gabazia.
259. Iwu nke mbụ gunyeazi njọ nk’ilụ ife di asọ, na njọ ili ego n’ife Nzụkọ nime njọ
medidelu ya?
Eye, njọ nine nk’ilụ ife di asọ na njọ ili ego n’ife nzukọ: bụ njọ medidelu iwu nke mbụ.