IFUNANYA
241. Gini bụ ifunanya?
Ifunanya bụ onyinye mmụọ Chukwu ji eme ọgọ n’ya k’anyi ji afunari Chukwu n’anya
kalisia ife nụ fuazi mmadu ib’anyi n’anya, k’anyi si fu onw’anyi mak’i Chukwu.
242. Maka g’nị k’anyi g’eji n’afụ Chukwu n’anya?
Anyi g’afụ Chukwu n’anya makan’ọ difelu mma oke n’onw’ya, difeazi mma oke n’ebe
anyi nọ.
243. Kedu k’esi ama n’anyi fụlụ Chukwu n’anya?
K’esi ama n’anyi fụlụ Chukwu n’anya bụ site n’idebe iwu ya, makana Kristi kwulu; ọ bụlụ
n’i fụlụ mn’anya debe iwu m.
244. Fa didụ iwu one dinụ?
Fa di iwu ili.
245. Gụa iwu ili?
1. Abụ m Nna, Chukwu gi, ngi enwena Chukwu ọzọ belusọ m.
2. Ngi ewena afa Chukwu gi na nkiti.
3. Cheta k’i debe mbọsi ụka asọ.
4. Sọpụlụ nna ị na nne ị.
5. Ngi egbun’ọchụ.
6. Ngi ayin’ọyị.
7. Ngi ezun’ori.
8. Ngi agbana ama asị medide mmadụ ibe ị.
9. Ngi ejin’alụ nwunye mmadu ibe ị anya ukwu.
10.Ngi ejin’alụ ọkụ mmadụ ibe ị anya ukwu.
246. Onye malu iwu ili a?
Chukwu nyelu Moses iwu ili n’Agba ochie Kristi mekwue fa s’ike na agba ọfụ.