GINI BỤ OKWUKWE
9. Gịnị bụ okwukwe?
Okwukwe bụ onyinye mụọ Chukwu ji eme ọgọ nke n’ enyel’ anyị aka ịkwelụnụghalụ ịtụ uche ọbụna n’ ife Chukwu egosina.
10.Gịnị kpatalụ ị g’ eji n ekwe n ife ọbụna Chukwu gosili?
Ife kpatalụ m g’ eji n’ ekwe n’ ife ọbụna Chukwu gosili bụnaChukwu bu eziokwu afụ, ọ m’ alafunata mmadụ, nke mmadụ n’ alafu ya.
11. Kedu k’ ị ga esi n’ ama ife Chukwu gosili?
Ka m g’ esi n’ ama ife Chukwu gosilibụ sit’ na ama na nkuzi, n’ ike nke Nzuko Katoliiki.
12. Ked’ ebe eziokwu afụ Chukwu gosili Nzụkọ ya dịga?
Faa di nime Akwụkwọ di asọ na nime nkuzi odịbendị nke nzụkọ.
13. Gịnị bụ Akwụkwọ dị asọ?
Ọ bụ okwu nke Chukwu dị n’ Akwụkwọ dị asọ edelu sit’ na nkuzi nke Mụọ- nsọ ya k’akpọrọu Baibụlụ.
14. Kedu k’ esi kee Akwụkwọ dị asọ- afụ?
Ekera ya ụzọ abụọ: Agba ochie n’ agba ọfụụ.
15. Gịnị bụ nkuzi ọdibendị nke nzụkọ?
Ọ bụga okwu nke Chukwu an’ ederọ nime Akwụkwọ dị asọ, nke si n’ aka fereaka wee ruo anyị aka.
16. Ọ bụrụ’ anyị iwu ikwelu ife ọ kụziri’ anyị bụ nkuzi nke ọdịbendị a?
Eye, makana mmụọ-nsọ kwuazịrị okwu n’ onu ndị Apọọsụrụk’ o si kwuazi sit’ na akwụkwọ odide fa dịka Apọọsụrụ Pọọlụ dị asọ kwụrụ sị: Nyabụ ụmụ nna m kwusie nu ike we jide nkuzi odịbendị nk’ akuzịri sit’ na okwu mọbụ site na akwụkwoanyị (Thess. 11:14).
17. Maar’ anyị atụ ife ụfọdụ akụzịgalụ site n’ ọdịbendị nke nzụkọ?
Ọmụma atụ ụfọdụ bụga: Baptiizim ụmụ-aka, iwu ido mbọs ụka asọ ghalụ mbọsị Sabaatị.
18Onye nyelụ nzụkọ Katoliiki ike na mmụọ iji n’akuzi nkuzi?
Onye nyelụ nzụkọ Katolikii ike nke mmụọ iji n’ akụzi nkụzi bụ Jesu Kristi, ekp’ o ji sị: Jebe nụ gaakụzibelụ nụ mba nine.